Zefanaya 1:1-18 BIU
[1] Okwu ONYENWE ANYỊ nke rutere Zefanaya, nwa Kushi, nwa nwa Gedaliya, bụ nwa Amaraya. Amaraya bụ nwa Hezekaya. Ozi a bịara nʼoge Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda. [2] “Aga m azachapụ ihe niile site nʼelu ụwa,” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. [3] “Aga m azachapụ mmadụ na anụmanụ. Aga m azachapụ ụmụ anụ ufe niile nke dị nʼeluigwe, zachapụkwa azụ niile nke dị nʼosimiri, na arụsị niile dị iche iche nke na-eme ka ndị ajọ mmadụ sụọ ngọngọ.” “Mgbe m kpochapụrụ mmadụ niile site nʼelu ụwa,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. [4] “Aga m esetipụ aka m megide Juda, megidekwa ndị niile bi na Jerusalem. Aga m ebipụkwa ndị niile na-efe Baal fọdụrụ nʼebe a, na aha ndị nchụaja arụsị niile, ma ndị nchụaja niile na-ekpere arụsị, [5] bụ ndị ahụ niile na-anọ nʼelu ụlọ ha na-akpọ isiala nye ọnwa na kpakpando, ha na ndị ahụ niile na-akpọrọ Onyenwe anyị isiala, na-eji aha ya nʼaṅụ iyi, ma na-ejikwa Milkọm na-aṅụ iyi, [6] na ndị ahụ niile na-alaghachi azụ site nʼiso ONYENWE ANYỊ, na ndị ahụ na-adịghị achọ ONYENWE ANYỊ, maọbụ jụta ase site nʼaka ya.” [7] Dere duu nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ nʼihi na ụbọchị ikpe ya ahụ dị egwu na-abịa nso. ONYENWE ANYỊ ejikerela ịchụ aja; o doola ndị ọ kpọrọ oriri nsọ. [8] “Nʼụbọchị ịchụ aja nke ONYENWE ANYỊ ahụ, aga m ata ndịisi niile na ụmụ eze niile, na ndị niile na-eyi uwe e si na mba ọzọ bubata ahụhụ. [9] Nʼụbọchị ahụ, aga m ata ha ahụhụ bụ ndị niile na-adịghị azọ ụkwụ nʼọnụ ụzọ mbata, ndị ji ihe ike na aghụghọ na-emejupụta ụlọ arụsị ha. [10] “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya, “olu iti mkpu akwa ga-esite nʼỌnụ Ụzọ Ama Azụ daa, mkpu nke ịkwasi akwa ike ga-ada site nʼebe obibi ọhụrụ ahụ, na ụzụ oke ntiwa site nʼugwu nta niile. [11] Kwasienụ akwa ike unu ndị niile bi nʼakụkụ ebe ahịa dị; nʼihi na a ga-egbuchapụ ndị ahịa unu niile. Ndị niile na-eji ọlaọcha azụ ahịa ka a ga-ebibi. [12] Nʼoge ahụ, aga m eji oriọna nyobanyechaa anya nʼakụkụ niile nke Jerusalem. Aga m ata ndị ahụ niile na-anọ nʼahụ dị jụụ ahụhụ, bụ ndị ahụ dọọrọ dịka ike mmanya a ṅụfọdụrụ aṅụfọ, ndị na-eche nʼobi ha sị, ‘O nweghị ihe ONYENWE ANYỊ ga-eme anyị, maọbụ ihe ọma, maọbụ ihe ọjọọ.’ [13] Akụ ha ga-abụ ihe a kwakọrọ nʼike, a ga-akwatukwa ụlọ ha niile. Ọ bụ ezie na ha ga-ewu ụlọ, ma ha agaghị ebi nʼime ha; ọ bụ ezie na ha ga-akọ ubi vaịnị, ma ha agaghị aṅụ mmanya si na ha.” [14] Oke ụbọchị ONYENWE ANYỊ na-abịa nso, ọ na-abịakwa ọsịịsọ. Gee ntị! Iti mkpu akwa nke ụbọchị ONYENWE ANYỊ ga-adị ilu nke ukwuu. A ga-anụkwa ụzụ ndị bụ dike nʼagha nʼebe ahụ. [15] Ụbọchị ahụ ga-abụ ụbọchị ọnụma, ụbọchị ahụhụ na mkpagbu, ụbọchị nsogbu na mbibi, ụbọchị ọchịchịrị na oke obi ọjọọ, ụbọchị igwe ojii, na oke ọchịchịrị, [16] ụbọchị opi ike na iti mkpu agha imegide obodo niile e wusiri ike, na imegide akụkụ ụlọ elu niile. [17] “Aga m eme ka oke nhụju anya bịakwasị ndị mmadụ, mee ka ha jegharịa dịka ndị kpuru ìsì, nʼihi na ha emehiela megide ONYENWE ANYỊ. A ga-awụsịkwa ọbara ha dịka uzuzu, tufukwaa anụ ahụ ha dịka nsị anụ. [18] Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị azọpụta ha nʼụbọchị ọnụma nke ONYENWE ANYỊ ahụ.” A ga-erechapụ ụwa niile site nʼọkụ ekworo ya, nʼihi na ọ bụ na mberede ka ọ ga-eme ka ndị niile bi nʼụwa gwụsịa.
