Habakuk 3:1-19 BIU
[1] Nke a bụ ekpere Habakuk onye amụma kpere. Ọ dị nʼusoro Shiginot. Nke a bụ ihe o kwuru. [2] ONYENWE ANYỊ anụla m ihe niile e kwuru banyere ude gị. Ịdị ukwuu nke ọrụ gị niile na-emekwa ka m dere duu nʼegwu nʼihu gị, ONYENWE ANYỊ. Mekwaa ya ọzọ nʼoge nke anyị, mekwaa ka anụ akụkọ ya nʼọgbọ anyị. Nʼoke iwe gị chetakwa ebere. [3] Chineke si na Teman bịa, Onye Nsọ ahụ sikwa nʼugwu Paran. Sela Ebube ya na-ekpuchi eluigwe, otuto ya jupụtakwara nʼụwa. [4] Ịma mma ya na-achapụta dịka ihe anyanwụ ụtụtụ, ihe na-enwupụta site nʼaka ya, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka e zoro ike ya. [5] Nʼihu ya ka ajọ ọrịa na-efe efe na-aga, oke mbibi na-esokwa ya nʼazụ. [6] O guzoro ọtọ yọgharịa ụwa; o lere anya, mee ka mba niile maa jijiji. Ugwu ukwu ochie ahụ niile dara, ugwu nta ochie ndị ahụ dakwara. Nʼihi na ụzọ ya ga-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi. [7] Ahụrụ m ụlọ ikwu nke Kushan ka ha nọ ọnọdụ ụbọchị ọjọọ, na ebe obibi ndị Midia ka ha nọ na oke ahụ ụfụ. [8] Ọ bụ osimiri, ka gị bụ ONYENWE ANYỊ were iwe megide? Ọnụma gị, ọ dị ukwuu megide iyi niile? Oke iwe gị ọ bụ megide oke osimiri mgbe ị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya gị, nakwa nʼelu ụgbọ ịnyịnya ị wetara ndị nke gị mmeri? [9] I kpughepụrụ ụta gị, kpọọ oku ka a chịtara gị ọtụtụ àkụ. Sela I ji osimiri dị iche iche kewaa ụwa. [10] Mgbe ugwu niile hụrụ gị ha nyagharịrị onwe ha nʼihi ihe mgbu bịakwasịrị ha. Oke mmiri ozuzo gabigakwara. Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda, buliekwa ebili mmiri elu. [11] Anyanwụ na ọnwa guzokwara duu na mbara eluigwe, mgbe ha hụrụ ihe nke àkụ gị, mgbe ha hụrụ amụma nke ùbe gị gburu. [12] I sitere nʼọnụma gị zọgharịa ije nʼụwa, sitekwa nʼiwe gị zọchaa mba dị iche iche dịka ọka. [13] Ị pụtara ịzọpụta ndị gị, ịzọpụta onye ahụ i tere mmanụ. Ị zọpịara isi onyendu nke ala ajọ omume ahụ, gbawa ya ọtọ site nʼisi ruo nʼụkwụ. [14] Ọ bụ ùbe ya ka i ji mawaa ya isi, mgbe ndị dike nʼagha ya bịara dịka oke ifufe ịchụsa anyị, mgbe ha si nʼobi ụtọ ha chee na ha na-aga iripịa ndị ogbenye e wedara nʼala, bụ ndị na-ezo onwe ha. [15] Ị chịrịla ịnyịnya gị zọọ ije nʼoke osimiri, kpagharịa mmiri ukwu ndị ahụ. [16] Amara m jijiji nʼobi m mgbe m nụrụ ihe ndị a niile, egbugbere ọnụ m abụọ kụkọtara nʼegwu, ọkpụkpụ dị m nʼahụ malitere ire ure, mee ka ụkwụ m maa jijiji. Ma aga m eji ndidi chere ụbọchị ọjọọ ahụ nke ga-abịakwasị ndị ahụ na-abịa ibuso anyị agha. [17] A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru, na ọ dịghị mkpụrụ dị nʼosisi vaịnị, a sịkwa na mkpụrụ osisi oliv ebilata na ala ubi niile emepụtaghị ihe oriri, a sịkwa na ọ dịghị atụrụ dị nʼọgba anụ, na ọ dịkwaghị ehi nọ nʼụlọ anụmanụ, [18] mụ onwe m ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ nʼime ONYENWE ANYỊ. Aga m etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke Onye nzọpụta m. [19] Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ bụ ike m, ọ na-eme ụkwụ m abụọ ka ha dịka nke ele. Ọ na-emekwa ka m zọọ ije nʼebe niile dị elu. Nke a dịrị onyeisi abụ, nʼụbọ akwara m dị iche iche.
