Jeremaya 31:1-40 BIU
[1] “Nʼoge ahụ,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara ya, sị, “Aga m abụ Chineke nke agbụrụ Izrel niile. Ha ga-abụkwa ndị m.” [2] Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, “Ndị ahụ gbanarịrị mma agha ga-ahụta ihuọma nʼọzara. Aga m abịa iwetara Izrel izuike.” [3] ONYENWE ANYỊ mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị, “Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi ka m ji hụ gị nʼanya; Ọ bụ ebere nke na-adịghị agbanwe ka m ji dọta unu nso. [4] Aga m ewulikwa gị elu ọzọ, e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke. Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọ soro ndị ọṅụ juru obi tee egwu. [5] Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige nʼelu ugwu Sameria. Ndị ọrụ ubi kụrụ ya ga-erikwa mkpụrụ si na ya. [6] Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha, ‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn, ka anyị jee nʼihu ONYENWE ANYỊ Chineke anyị.’ ” [7] Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, “Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb, tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu. Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ, ‘ONYENWE ANYỊ, biko, zọpụta ndị gị, bụ ndị Izrel fọdụrụ.’ [8] Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha; aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha. Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ, na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme. Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu! [9] Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta, ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha. Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi, nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha, nʼihi na aghọọlara m Izrel nna, Ifrem bụkwa ọkpara m. [10] “Nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ, unu mba niile; kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile. Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha. Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. [11] Nʼihi na ONYENWE ANYỊ ga-agbapụta Jekọb, ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike. [12] Ha ga-abịa nọọ nʼugwu Zayọn tie mkpu ọṅụ, ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị ukwu nke ezi ihe ONYENWE ANYỊ nyere ha, dịka ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ, na ụmụ igwe ewu na atụrụ, na ọtụtụ ehi. Ha ga-adị ka ubi a na-agba mmiri mgbe niile; ha agaghị erukwa ụjụ ọzọ. [13] Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ, ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ. Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ, aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute. [14] Aga m emekwa ka afọ jubiga ndị nchụaja oke nʼihi ịdị ukwuu nke onyinye ha ga-enweta, afọ ezi ihe m ga-ejukwa ndị m,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. [15] Ihe ndị a bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru, “A nụrụ otu olu na Rema, iru ụjụ na oke ịkwa akwa. Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya, o kwekwaghị ịnabata nkasiobi a na-akasị ya, nʼihi na ụmụ ya adịghịkwa.” [16] Ma otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, “Jide olu gị aka, ka ọ ghara ịkwa akwa, jidekwa anya gị abụọ, ka ha ghara ịgba anya mmiri, nʼihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ gị.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. “Ha ga-esite nʼala ndị iro ha lọtakwa. [17] Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. “Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha. [18] “Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị, ‘Ị dọọla m aka na ntị dịka nwa ehi nke na-eme isiike. Lee, amụtala m ihe ị chọrọ ka m mụta site nʼịdọ aka na ntị gị. Ya mere, kpọlata m, ka m nwee ike lọtakwa, nʼihi na ị bụ ONYENWE ANYỊ na Chineke m. [19] Mgbe m kpafuru, echegharịrị m. Mgbe m ghọtakwara, e tiri m aka nʼobi m, ihere mere m, ọ wutekwara m nʼihi nʼọnọdụ ihe ihere nʼihi ụdị ndụ m biri nʼokorobịa m.’ [20] Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke, onye ihe ya na-atọ m ụtọ? Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya, ma anọkwa m na-echeta ya. Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike. Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. [21] “Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama, manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama. Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile, bụ okporoụzọ unu ga-eso. Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, laghachi nʼobodo gị ndị a. [22] Ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-awagharị, gị nwaagbọghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi Izrel? Nʼihi na ONYENWE ANYỊ na-aga ime ihe ọhụrụ nʼụwa; nwanyị ga-anọ nwoke gburugburu.” [23] Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru, “Mgbe m si na mba ọzọ kpọghachi ha, ndị ga-ebi nʼala Juda na nʼime obodo ya niile ga-ekwu okwu ndị a ọzọ sị: ‘ONYENWE ANYỊ gọzie gị, gị ebe obibi dị nsọ, gị ugwu dị nsọ.’ [24] Ndị mmadụ ga-ebikọta ọnụ na Juda na nʼobodo niile dị nʼime ya, ma ndị na-arụ ọrụ ubi, ma ndị na-elekọta igwe ewu na atụrụ ha. [25] Aga m enwoghakwa ike ndị na-ada mba, meekwa ka afọ ju ndị ike gwụrụ.” [26] Nʼoge a, esi m nʼụra teta, lee anya gburugburu m. Ụra m rahụrụ tọrọ m ụtọ nke ukwuu. [27] Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe m ga-akụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nʼụlọ Izrel na nʼụlọ Juda. [28] Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ.” Ọ bụ otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. [29] “Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa, “ ‘Nna anyị ha arachaala mkpụrụ osisi na-achaghị acha, ma lee, eze ụmụ ha na-ejiji ejiji.’ [30] Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji. [31] “Lee, oge na-abịa,” ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, nakwa ụlọ Juda. [32] Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe ahụ m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m, ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. [33] “Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. “Aga m etinye iwu m nʼime obi ha, aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha. Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m. [34] Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara ONYENWE ANYỊ,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. “Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.” [35] Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, bụ onye ahụ họpụtara anyanwụ mee ka ọ na-enye ihe nʼehihie, onye ahụ nyere ọnwa na kpakpando iwu ka ha na-enye ihe nʼanyasị, onye na-akpali oke osimiri, na-eme ka ebiliri mmiri na-ebigbọ. Aha ya bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile. [36] Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, “Ọ bụ naanị ma ụkpụrụ ndị a ọ pụrụ nʼihu m, ghara ịdịkwa, ka a ga-eme ka ụmụ ụmụ Izrel ghara ịdị, ka ha ghara ịbụkwa mba nʼihu m ọzọ.” [37] Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, “Ọ bụ naanị mgbe e nwere ike ịtụ ma chọpụta ịsa mbara nke mbara eluigwe, na ịdị omimi nke ntọala ụwa, ka m ga-ajụ ụmụ ụmụ niile nke Izrel, nʼihi ihe niile ha mere.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. [38] “Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, mgbe a ga-ewugharị obodo a nye m, site nʼụlọ elu Hananel ruo nʼọnụ ụzọ ama Akụkụ. [39] Ịdị ogologo nke eriri ọtụtụ a ga-eji tụọ ya ga-adị ka site nʼihu ọnụ ụzọ ama ahụ ruo nʼugwu Gareb, gaakwa ruo Goa. [40] Ndagwurugwu ahụ niile ebe a tụnyere ozu ndị mmadụ, na ebe e kpofuru ntụ, na mgbada ugwu ahụ niile ebe e doziri edozi maka ịkụ ihe, ruo na ndagwurugwu iyi Kidrọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama ịnyịnya, ga-aghọkwa ebe dị nsọ nye ONYENWE ANYỊ. A gaghị ehopukwa obodo ahụ ọzọ, maọbụ tikpọọ ya.”
