Jeremaya 17:1-27 BIU

[1] “E ji mkpisi igwe gbunye mmehie Juda, jikwa ọnụ nkume siri ike a pịrị ọnụ ya apị, depụta nʼelu mbadamba nkume, bụ obi ha, nakwa nʼelu mpi niile nke ebe ịchụ aja ha. [2] Ọ bụladị ụmụ ha na-echeta ebe ịchụ aja ha, na ogidi a manyere nʼala nʼihi arụsị Ashera, nke dị nʼebe ọtụtụ osisi ndụ na-etokọ ọnụ, ma nʼelu ugwu nta niile. [3] Ugwu m, nke dị nʼala ahụ, na ihe niile ha nwere, na akụnụba ha ka m ga-eweta nye ndị ga-adọta ha nʼagha. Aga m enyekwa ha ihe niile ahụ dị nʼelu ugwu, nʼihi mmehie gị, nke jupụtara nʼala gị niile. [4] Ihe nketa ahụ m nyere gị ga-efunarị gị, nʼihi ihe i ji aka gị wetara onwe gị. Aga m emekwa ka ị bụrụ ohu ndị iro gị nʼala nke ị na-amaghị, nʼihi na ị kpasuola iwe m, ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe niile ebighị ebi.” [5] Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi, onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka, onye wezugara obi ya site nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ. [6] Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu. Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya. Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara, nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị. [7] “Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị ONYENWE ANYỊ obi ya. Onye ịnya isi ya bụ nʼime ONYENWE ANYỊ. [8] Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ. Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ, akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya. Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị. Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.” [9] Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile, o nwekwaghị ngwọta. Onye pụrụ ịghọta ya? [10] “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ na-enyocha obi, na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ, nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.” [11] Dịka ọkwa si ekpokọba akwa ọ na-eyighị, otu a ka ndị na-akpakọba akụ nʼụzọ na-ezighị ezi dị. Nʼetiti ụbọchị ndụ ha, akụ ndị a ga-efunarị ha. Nʼikpeazụ ha ga-aghọ ndị nzuzu. [12] Ocheeze dị ebube, nke e mere ka ọ dị elu site na mmalite, ka ebe nsọ anyị bụ. [13] ONYENWE ANYỊ, olileanya Izrel ka ị bụ. A ga-emekwa ka ihere mee ndị na-agbakụta gị azụ. A ga-edekwa aha ndị ahụ niile si nʼebe ị nọ wezuga onwe ha nʼala, nʼihi na ha ewezugala onwe ha site nʼebe ONYENWE ANYỊ, isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, nọ. [14] ONYENWE ANYỊ, ọ bụrụ na i mee ka ahụ sie m ike aga m adị ndụ. Ọ bụrụ na ị zọpụta m aga m abụ onye azọpụtara, nʼihi na ọ bu naanị gị ka m na-eto. [15] Ha nọ na-ajụ m ọnụ, na-asị m, “Olee ebe okwu ONYENWE ANYỊ dị? Ya mezuonụ ugbu a!” [16] Ma esitebeghị m na ị bụ onye ọzụzụ atụrụ gị wezuga onwe m. Ị maara na ọ bụghị ọchịchọ obi m ịhụ ụbọchị ahụ na-eweta ịda mba. Ị maara ụdị okwu niile na-esite nʼọnụ m na-apụ. [17] A ghọrọla m ihe na-eyi egwu, nʼihi na ị bụ ebe mgbaba m nʼụbọchị mbibi. [18] Mee ka ihere mee ndị na-akpagbu m. Ekwekwala ka ihere mee m. Mee ka ha tụọ ụjọ, ma chebe m site nʼihe egwu. Mee ka ụbọchị mbibi bịakwasị ha, werekwa okpukpu ihe mbibi abụọ tipịa ha. [19] Ihe a ka ONYENWE ANYỊ gwara m, “Gaa, guzo nʼọnụ ụzọ ama obodo, ebe ndị eze Juda na-esi apụ, ma na-abatakwa. Guzokwa nʼọnụ ụzọ ama ndị ọzọ niile dị na Jerusalem. [20] Gwa ha sị, ‘Nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ, unu ndị eze Juda na ndị Juda niile, na ndị niile bi na Jerusalem, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a apụ, na-abatakwa.’ [21] Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, ‘Lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu ebughị ibu ọbụla nʼụbọchị izuike; lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu esiteghị nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem bufee ya. [22] Unu esitela nʼụlọ unu buputa ihe ọbụla, unu arụkwala ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike. Doonụ ụbọchị izuike nsọ dịka m nyere nna unu ha nʼiwu. [23] Ma ha egeghị ntị, maọbụ kpọọ ya mkpa ha. Ha bụ ndị ntị ike, ndị na-adịghị aṅa ntị nʼịdọ aka na ntị, maọbụ nabata ya. [24] Ma otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, ọ bụrụ na unu ga-elezi anya rubere m isi, hapụ isi nʼọnụ ụzọ ama obodo a bufee maọbụ bubata ibu nʼụbọchị izuike, kama debe ụbọchị izuike nsọ, site na-arụghị ọrụ ọbụla nʼime ya, [25] mgbe ahụ, ndị eze ndị ga-anọkwasị nʼocheeze Devid ga-edu ndị na-ejere ya ozi na-agafe na-abatakwa site nʼọnụ ụzọ ama a. Ha na ndị na-ejere ha ozi ga-anọkwasị nʼịnyịnya ha, na nʼụgbọ agha ha, mgbe ha sị nʼọnụ ụzọ ama a na-abata, ma na-apụ. Ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem ga-esokwa ha nʼazụ. Aga m emekwa ka ndị mmadụ biri nʼobodo a ruo mgbe ebighị ebi. [26] Ndị mmadụ ga-esite nʼobodo niile nke Juda, na nʼobodo nta gbara Jerusalem gburugburu; ha ga-esitekwa nʼala ndị Benjamin, na nʼala ndagwurugwu nke ugwu ndị ahụ dị nʼọdịda anyanwụ, sitekwa nʼala Negev, na-ewebata onyinye aja nsure ọkụ, na aja dị iche iche, na onyinye ọka, na onyinye ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na onyinye ekele, nʼime ụlọ ONYENWE ANYỊ. [27] Ma ọ bụrụ na unu enupu isi jụ idebe ụbọchị izuike nsọ, ọ bụrụ na unu anọgide na-ebubata ihe site nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼụbọchị izuike, aga m amụnye ọnụ ụzọ ama niile dị na Jerusalem ọkụ, nke a na-apụghị imenyụ emenyụ. Ọ ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike na Jerusalem.’ ”

About this translation

Life Bible app icon
Get the Life Bible app Read offline, sync highlights and notes, and study with your library on any device.