Jeremaya 18:1-23 BIU

[1] Nke a bụ okwu nke sị nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ bịakwute Jeremaya. [2] “Bilie, jee nʼụlọ ọkpụ ite, ebe ahụ ka m ga-anọ zie gị ozi.” [3] Ya mere, ebiliri m jee nʼụlọ ọkpụ ite, bịakwute ya mgbe ọ nọ na-arụ ọrụ na nkume ịkpụ ihe. [4] Ma ite ahụ ọ chọrọ ịkpụ apụtaghị dịka ọkpụ ite si chọọ ya, nʼihi ya, ọ kpụkọtara ụrọ ahụ ọzọ, malitekwa ịkpụgharị ya. [5] Mgbe ahụ okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, [6] Ọ sịrị, “Ọ bụ na m apụghị ime unu dịka ọkpụ ite a mere, unu ụmụ Izrel?” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, “Dịka ụrọ si dị nʼaka ọkpụ ite ahụ, otu a ka unu onwe unu si dịrị nʼaka m, gị Izrel. [7] Mgbe ọbụla m kpọsara na a ga-akwada maọbụ bibie, maọbụ si nʼọnọdụ ya hopu mba maọbụ alaeze ọbụla, [8] ọ bụrụ na mba ahụ m dọrọ aka na ntị esite na mmehie ha chegharịa, a gaghị ebibi ya dịka m si zube. [9] Ọzọ, ọ bụrụ na m akpọsaa na a ga-ewuli mba ọbụla maọbụ alaeze ọbụla elu, kụọkwa ya, [10] ọ bụrụ na o mee ihe jọrọ njọ nʼanya m, jụ irubere m isi, agaghị m emere ya ihe ọma ahụ m zubere imere ya. [11] “Ugbu a, gwa ndị Juda na ndị ahụ bi na Jerusalem, sị, ‘Otu a ka ONYENWE ANYỊ sịrị: Lee, ana m akwado mbibi nke ga-abịakwasị unu; ana m echekwa echiche ọjọọ megide unu. Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu site nʼụzọ ọjọọ ya chegharịa, ya meekwa ka ụzọ ya na omume ya zie ezi.’ [12] Ma ha ga-aza sị, ‘O nweghị isi! Anyị ga-anọgide na-eme ihe ọbụla anyị chepụtara nʼechiche anyị, na-emekwa atụmatụ isiike nke obi ọjọọ anyị tụpụtara.’ ” [13] Nʼihi ya ka ONYENWE ANYỊ ji kwuo sị, “Jụtanụ ajụjụ nʼetiti mba niile, onye nụrụla ihe dị otu a? Ndị m, Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke emeela ihe jọgburu onwe ya. [14] O nweela mgbe mmiri oyi m mere ka ọ kpụkọtaa kọrọ nʼelu ugwu Lebanọn? O nweela mgbe mmiri ya jụrụ oyi, nke si nʼebe dị anya na-asọdata ji akwụsị ịsọ asọ? [15] Ma ndị m echezọọla m. Ha na-achụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị na-enweghị isi, bụ arụsị ndị ahụ mere ka ha sọọ ngọngọ nʼụzọ ha niile. Ha sụrụ ngọngọ hapụ ịgbasokwa ụzọ ọma ahụ dị site na mgbe ochie. Kama ha na-eje ije nʼụzọ ọhịa, nke na-enweghị ụkpụrụ, nke a na-ewuzighị ewuzi. [16] Ala ha ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọ ihe iju anya ruo ebighị ebi. Ndị si nʼakụkụ ya na-agafe ga-efufe isi ha, nʼihi na ihe ha ga-ahụ ga-eju ha anya. [17] Aga m achụsa ha nʼihu ndị iro ha dịka ifufe na-efe site nʼọwụwa anyanwụ. Aga m agbakụta ha azụ. Ha agaghị ahụkwa ihu m anya nʼụbọchị ahụ mbibi ga-abịakwasị ha.” [18] Ha sịrị, “Bịanụ ka anyị gbaa izu megide Jeremaya, nʼihi na izi iwu agaghị esite nʼebe ndị nchụaja nọ kwụsị, maọbụ ndụmọdụ nʼebe ndị maara ihe, ma ọ bụkwanụ okwu site nʼebe ndị amụma nọ. Ya mere, bịanụ ka anyị were ire anyị buso ya agha, gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ọbụla nke ọ na-ekwu.” [19] Gee m ntị, ONYENWE ANYỊ. Nụrụ ihe ndị na-ebo m ebubo na-ekwu megide m. [20] O kwesiri iji ajọ omume kwụghachi ihe ọma? Ma lee na ha egwuolara m olulu. Chetakwa na m guzooro nʼihu gị ma rịọ gị arịrịọ nʼihi ha. Arịrịọ m bụ ka ị hapụ iweso ha oke iwe. [21] Ya mere, were ụmụ ha nyefee nʼaka ụnwụ. Werekwa ha onwe ha nyefee nʼaka mma agha. Mee ka ndị nwunye ha ghọọ ndị gba aka ụmụ na di. Meekwa ka e gbuo ndị ikom ha, ka mma agha gbukwaa ụmụ okorobịa nʼọgbọ agha. [22] Mee ka e site nʼụlọ ha nụ mkpu akwa, mgbe i mere ka ndị iro ha buso ha agha na mberede. Nʼihi na ha egwuola olulu ijide m, ha esiekwarala m ọnya nzuzo ijide m nʼụkwụ. [23] Ma gị onwe gị, ONYENWE ANYỊ, maara nzube ọjọọ ha niile igbu m. Agbagharala ha ajọ omume ha; maọbụ hichapụ mmehie ha site nʼihu gị. Mee ka ụkwụ ha gbuchapụ ka ha daa nʼihu gị; mesie ha ike mgbe ị na-ewe iwe.

About this translation

Life Bible app icon
Get the Life Bible app Read offline, sync highlights and notes, and study with your library on any device.