[1] Mgbe Jehoshafat, eze Juda, laghachiri nʼụlọ ya na Jerusalem nʼudo. [2] Jehu nwa Hanani, onye ọhụ ọhụ, pụrụ gaa izute ya; ọ sịrị eze Jehoshafat, “O kwesiri ka i nyere onye ọjọọ aka? Ọ bụkwa ndị na-akpọ ONYENWE ANYỊ asị ka ị na-ahụ nʼanya? Nʼihi nke a iwe ọkụ ONYENWE ANYỊ adakwasịla gị. [3] Ma otu ọ dị, achọtara ezi ihe nʼime gị, i sitela nʼala a wezuga ogidi Ashera niile, dozieekwa obi gị ịchọ Chineke.” [4] Jehoshafat biri na Jerusalem. Ọ pụrụ gagharịa nʼetiti ndị ya site na Bịasheba ruo nʼobodo ugwu ugwu Ifrem, laghachikwutekwa ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke nke nna nna ha. [5] Ọ họpụtara ndị ikpe nʼala ahụ, nʼotu nʼotu nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike nke Juda. [6] Ọ gwara ha si, “Lezienụ anya ihe unu na-eme nʼihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe kama ọ bụ ONYENWE ANYỊ, onye na-anọnyere unu mgbe unu na-ekpebi ikpe. [7] Ugbu a, kwenụ ka egwu ONYENWE ANYỊ dịrị nʼime unu. Kpeenụ ikpe ziri ezi, nʼihi na nʼebe ONYENWE ANYỊ Chineke anyị nọ, ikpe ikpe na-ezighị ezi, maọbụ ile mmadụ anya nʼihu maọbụ iri ngarị adịghị ya.” [8] Ọzọkwa, nʼime Jerusalem, Jehoshafat họpụtara ụfọdụ ndị Livayị, na ndị nchụaja, na ndịisi ezinaụlọ Izrel ka ha bụrụ ndị na-ahazi iwu nke ONYENWE ANYỊ na-edozikwa esemokwu. Ha bikwa na Jerusalem. [9] O nyere ha iwu ndị a, “Jirinụ ikwesi ntụkwasị obi, na ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ rụọ ọrụ unu. [10] Mgbe ọbụla ụmụnna unu ndị bi nʼobodo unu dị iche iche buteere unu ikpe igbu mmadụ maọbụ ikpe mmebi iwu ọbụla, maọbụ ihe megidere ihe e nyere nʼiwu, maọbụ nke megidere ụkpụrụ, ma ọ bụkwanụ megide iwu na usoro ime ihe, unu ga-adọ ha aka na ntị ka ha ghara imehie megide ONYENWE ANYỊ. Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe ONYENWE ANYỊ ga-adakwasị unu na ụmụnna unu. Ma ọ bụrụ na unu arụọ ọrụ unu nke ọma, unu agaghị emehie. [11] “Amaraya, onyeisi nchụaja, ga-abụ onyeisi unu nʼihe ọbụla metụtara ONYENWE ANYỊ. Zebadaya nwa nwoke Ishmel, onyeisi nke ebo Juda ga-abụ onyeisi unu nʼihe o bụla metụtara eze. Ndị Livayị ga-abụ ndịisi ozi nʼihu unu. Bụrụkwanụ ndị dị ike, unu atụkwala ụjọ, ka ONYENWE ANYỊ nọnyere ndị na-eme nke ọma.”