2 Ihe e mere 18:1-34 BIU

[1] Ugbu a, Jehoshafat nwere akụnụba na ugwu buru ibu, bịakwa ghọọ ọgọ Ehab. [2] Mgbe afọ ole na ole gasịrị, Jehoshafat gara Sameria ileta Ehab. Ehab gbuuru ya na ndị ya na ha yi ọtụtụ atụrụ na ehi, ọ kpọrọ oriri kwagide ya ka o buso Ramọt Gilead agha. [3] Ehab eze Izrel jụrụ Jehoshafat eze Juda, sị, “Ị ga-eso m buso Ramọt Gilead agha?” Jehoshafat zaghachiri, “Otu m dị ka gị onwe gị dị, ndị nke m bụkwa ndị gị. Anyị ga-eso gị gaa agha.” [4] Ma Jehoshafat gwakwara eze Izrel, sị, “Buru ụzọ chọpụta ntụziaka ONYENWE ANYỊ.” [5] Ya mere, eze Izrel kpọkọtara ndị amụma dị narị ndị ikom anọ nʼọnụọgụgụ jụọ ha, sị, “Anyị a ga-ebuso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ?” Ha zara, “Gaa, nʼihi na Chineke ga-enyefe ha nʼaka eze.” [6] Ma Jehoshafat jụrụ, “Ọ bụ na e nwekwaghị onye amụma ONYENWE ANYỊ nọ nʼebe a, onye anyị nwere ike ịjụta ase nʼaka ya?” [7] Eze Izrel zaghachiri Jehoshafat, sị, “A ka nwere otu onye amụma, onye anyị nwere ike isite nʼaka ya jụọ ONYENWE ANYỊ ase, ọ bụ Maikaya nwa Imla, ma akpọrọ m ya asị, nʼihi na o nweghị oge ọ na-ebu amụma ihe ọma nʼebe m nọ, kama ọ bụ naanị nke ọjọọ.” Jehoshafat sịrị, “Eze ekwesighị ikwu okwu dị otu a.” [8] Mgbe ahụ, eze Izrel kpọrọ otu onye na-ejere ya ozi sị ya, “Mee ọsịịsọ kpọta Maikaya nwa Imla nʼebe a.” [9] Ehab eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, onye ọbụla yi uwe eze ya, na-anọkwasị nʼocheeze ya nʼebe ịzọcha ọka nʼọnụ ụzọ ama e si abata obodo Sameria. Ndị amụma ahụ niile nọkwa na-ebu amụma nʼihu ha. [10] Zedekaya nwa Kenaana, mere mpi igwe, ọ kwupụtara sị, “Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ na-ekwu, ‘Ihe ndị a ka ị ga-eji sọgide ndị Aram, ruo mgbe a ga-ala ha nʼiyi.’ ” [11] Ndị amụma ndị ọzọ niile na-ebu otu ihe ahụ nʼamụma, na-asị, “Gaa, busoo Ramọt Gilead agha, ị ga-enwekwa mmeri, nʼihi na ONYENWE ANYỊ ga-enyefe ya nʼaka eze.” [12] Onyeozi ahụ nke gara ịkpọ Maikaya sịrị ya, “Lee, ndị amụma ndị ọzọ na-agụpụghị onye ọbụla na-ebu amụma ọganihu nye eze. Mee ka okwu gị na ha dakọta. Kwuokwa ihe ga-adị eze mma.” [13] Ma Maikaya sịrị, “Dịka ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ, aga m agwa ya naanị ihe Chineke m kwuru.” [14] Mgbe ọ bịarutere, eze jụrụ ya, “Maikaya, ọ bụ anyị gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ?” Ọ zara, “Gaa, ma nwekwa mmeri, nʼihi na a ga-enyefe ha nʼaka gị.” [15] Eze sịrị ya, “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọzọ, karịa naanị eziokwu nʼaha ONYENWE ANYỊ?” [16] Mgbe ahụ, Mikaya zara, “Ahụrụ m Izrel niile ka ha gbasasịrị nʼelu ọtụtụ ugwu dịka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ ma ONYENWE ANYỊ sịrị, ‘Ndị a enweghị onyendu, ka onye ọbụla laghachi nʼụlọ ya nʼudo.’ ” [17] Eze Izrel sịrị Jehoshafat, “Ọ bụ na m agwaghị gị na ọ dịghị mgbe ọ na-ebu amụma ihe ọma banyere m, kama naanị ihe ọjọọ?” [18] Maikaya gara nʼihu sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ: Ahụrụ m ONYENWE ANYỊ ka ọ nọkwasịrị nʼocheeze ya, hụkwa usuu nke eluigwe ka ha na-eguzo nʼaka nri ya nakwa nʼaka ekpe ya. [19] Ma ONYENWE ANYỊ sịrị, ‘Onye ga-aga rafuo Ehab, eze Izrel, ka ọ gaa buso Ramọt Gilead agha, gaa nwụọ nʼebe ahụ?’ “Otu onye tụpụtara aro nke a, ebe onye ọzọ tụpụtara nke ọzọ. [20] Nʼikpeazụ, otu mmụọ pụtara guzo nʼihu ONYENWE ANYỊ sị, ‘Mụ onwe m ga-arafu ya.’ “ONYENWE ANYỊ jụrụ ya sị, ‘Olee otu ị ga-esi mee nke a?’ [21] “Ọ zara, ‘Aga m apụ bụrụ mmụọ nrafu nʼọnụ ndị amụma ya niile.’ “ONYENWE ANYỊ sịrị, ‘Ị ga-enwe ike ịrafu ya. Gaa mee otu a.’ [22] “Ma ugbu a, ONYENWE ANYỊ etinyela mmụọ okwu ụgha nʼọnụ ndị amụma gị niile ndị a. ONYENWE ANYỊ ekwubiela nʼihe ọjọọ ga-adakwasị gị.” [23] Mgbe ahụ, Zedekaya nwa Kenaana, gara nso maa Maikaya aka na nti, jụọ ya, “Olee ụzọ ka mmụọ ahụ sitere na ONYENWE ANYỊ gara, mgbe ọ hapụrụ m bịa ịgwa gị okwu?” [24] Maikaya zaghachiri, “Ị ga-achọpụta nke a nʼụbọchị ị ga-agbaba nʼime ime ụlọ izo onwe gị.” [25] Eze Izrel nyere iwu sị, “Jidenụ Maikaya kpụgara ya Amọn, onye na-achị obodo a, na Joash, nwa eze. [26] Ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka eze sịrị: Tinye nwoke a nʼụlọ mkpọrọ, nye ya naanị achịcha na mmiri ọṅụṅụ tutu ruo mgbe m lọghachiri nʼudo.’ ” [27] Maikaya kwupụtara sị, “Ọ bụrụ na ị lọghachi nʼudo, ọ pụtara na ọ bụghị ONYENWE ANYỊ si nʼọnụ m kwuo okwu.” O kwukwara sị, “Unu niile, hụbakwanụ okwu m ndị a niile ama.” [28] Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat eze Juda pụrụ gawa Ramọt Gilead. [29] Eze Izrel gwara Jehoshafat, sị, “Aga m ejikere onwe m dịka m bụ onye ọzọ banye nʼọgbọ agha, ma gị onwe gị yiri uwe eze gị.” Ya mere, eze Izrel nwogharịrị onwe ya ka onye ọzọ baa nʼọgbọ agha. [30] Ma eze Aram enyelarị ndị ọchịagha, ndị na-agba ụgbọ agha iwu sị, “Unu ebusola onye ọbụla agha, maọbụ onye ukwu maọbụ onye nta, karịakwa naanị eze Izrel.” [31] Mgbe ndị ọchịagha na-achị ụgbọ agha hụrụ Jehoshafat, ha chere nʼobi ha, “Onye a bụ eze Izrel.” Nʼihi ya, ha tụgharịrị ibuso ya agha, ma Jehoshafat tiri mkpu, nke mere na ONYENWE ANYỊ nyeere ya aka. Chineke wezugara ha site nʼebe ọ nọ, [32] nʼihi na mgbe ndị ọchịagha, na-achị ndị na-agba ụgbọ agha hụrụ na ọ bụghị eze Izrel, ha kwụsịrị ịchụso ya. [33] Ma otu onye dọrọ ụta ya gbapụ ya na-ebughị onye ọbụla nʼobi, gbata ya eze Izrel nʼetiti njikọ ihe ikpuchi obi na uwe agha ya. Eze gwara onye ọkwọ ụgbọ agha, sị, “Tụgharịa, si nʼebe a bupụ m nʼihi na emerụọla m ahụ.” [34] Agha ahụ siri ike nʼụbọchị ahụ niile. Eze Izrel guzobere onwe ya ka ọ kwụrụ ọtọ nʼime ụgbọ agha ya na-eche ndị Aram ihu ruo uhuruchi. Ọ nwụrụ mgbe anyanwụ dara.

About this translation

Life Bible app icon
Get the Life Bible app Read offline, sync highlights and notes, and study with your library on any device.