2 Ihe e mere 1:1-17 BIU
[1] Solomọn nwa Devid mere onwe ya ka o guzosie ike nʼalaeze ya, nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke ya nọnyeere ya, meekwa ka ọ dị ukwuu hie nne. [2] Mgbe ahụ, Solomọn gwara ndị Izrel niile okwu, ya bụ, ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndị ikpe, na ndị ndu niile nọ nʼIzrel, na ndịisi ezinaụlọ niile. [3] Solomọn ya na ọgbakọ ahụ niile, gara nʼebe dị elu nke Gibiọn, nʼihi nʼebe ahụ ka ụlọ nzute Chineke dị, bụ nke Mosis onyeozi ONYENWE ANYỊ wuru nʼọzara. [4] Ma Devid esitelarị na Kiriat Jearim buputa igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ, bulaa ya nʼụlọ ikwu nke o wuru maka ya na Jerusalem. [5] Ebe ịchụ aja bronz ahụ Bezalel nwa Uri, nwa Hua wuru dịkwa na Gibiọn, nʼihu ụlọ nzute ONYENWE ANYỊ. Solomọn na ọgbakọ ahụ na-ajụta ya ase nʼebe bronz ahụ. [6] Solomọn jere nʼebe ịchụ aja ahụ e ji bronz kpụọ, nke dị nʼihu ONYENWE ANYỊ, nʼime ụlọ nzute, jiri anụ ụlọ ọnụọgụgụ ha dị otu puku chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ya. [7] Nʼabalị ụbọchị ahụ na Gibiọn, ONYENWE ANYỊ mere ka Solomọn hụ ya anya, sị ya, “Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị.” [8] Ma Solomọn zara Chineke, sị, “I gosila nna m bụ Devid obi ebere dị ukwuu. Ugbu a, i meekwala m eze nʼọnọdụ ya [9] Ugbu a, ONYENWE ANYỊ bụ Chineke, ka nkwa gị nke i kwere nna m, bụ Devid, bụrụ ihe e mezuru, nʼihi na ị meela m eze ndị a bara ụba nʼọnụọgụgụ dịka aja nke ala. [10] Biko, nye m amamihe na nghọta, nke m ga-eji edu ndị a napụ na-abata, nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?” [11] Chineke zara Solomọn sị ya, “Ebe ọ bụ na ị rịọghị m ka m nye gị akụnụba, maọbụ ogologo ndụ; ebe ọ bụkwa na ị rịọghị m ka m mee ka ndị kpọrọ gị asị nwụsịa, maọbụ ka m mee ka i nwee nsọpụrụ karịa, kama mkpa na-akpa gị bụ ka m nye gị amamihe na nghọta ị ga-eji duzie ndị m, nke m mere gị eze ha. [12] Ya mere, enyela gị amamihe na nghọta dịka ị rịọrọ. Aga m enyekwa gị akụnụba na nsọpụrụ dị ukwuu, nke eze ọbụla nke buru gị ụzọ na-enwebeghị. Ọ dịkwaghị onye nke ga-eso gị ga-enwe ụdị ya.” [13] Mgbe ahụ, Solomọn sitere nʼebe dị elu nke Gibiọn, site nʼihu ụlọ nzute ahụ, lọghachi na Jerusalem. Ọ chịrị dịka eze nʼIzrel. [14] Solomọn chịkọbara ọtụtụ ụgbọ agha na ịnyịnya dị iche iche. O nwere ụgbọ agha dị otu puku na narị anọ na ịnyịnya agha dị puku iri na abụọ nʼọnụọgụgụ, ndị o debere ụfọdụ nʼime ha nʼobodo ụgbọ agha ya ma ndị ọzọ dị na Jerusalem ebe ya onwe ya nọ. [15] Eze mere ka ọlaọcha na ọlaedo baa ụba na Jerusalem, dịka nkume efu. O mekwara ka osisi sida dị ọtụtụ dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche [16] A na-esite nʼIjipt nakwa ala Kue atụbatara Solomọn ịnyịnya. Ndị ahịa eze na-azụta ha site na Kue nʼọnụ ahịa a na-ere ha nʼoge ahụ. [17] Ha sitere nʼIjipt tụbata otu ụgbọ agha nʼọnụ ahịa narị shekel ọlaọcha isii; jirikwa otu narị shekel na iri shekel ise zụta otu ịnyịnya. Ha zipụkwara ha nye ndị eze niile nke ndị Het na ndị Aram.
