Jeremaya 42:1-22 BIU
[1] Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ niile, na Jezenaya nwa Hoshaya, na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu, bịakwutere [2] Jeremaya onye amụma sị ya, “Biko, anyị bịara ịrịọ gị arịrịọ. Kpọkuo ONYENWE ANYỊ Chineke gị nʼekpere nʼihi anyị bụ ndị fọdụrụ nʼala a. Ị maara na o nwere oge anyị dị ọtụtụ nʼala a, ma ugbu a anyị dị naanị ole na ole. [3] Kpee ekpere ka ONYENWE ANYỊ Chineke gị gosi anyị ihe anyị ga-eme, maọbụ ebe anyị ga-eje.” [4] Jeremaya onye amụma zara sị ha, “Anụla m ihe unu kwuru. Aga m ekpere ONYENWE ANYỊ Chineke unu ekpere dịka unu rịọrọ. Mgbe m natara ọsịsa ya, aga m agwakwa unu ihe niile ONYENWE ANYỊ kwuru. O nwekwaghị ihe m ga-ezonarị unu.” [5] Ha sịrị Jeremaya, “Ka ONYENWE ANYỊ bụrụ onyeama eziokwu na nke kwesiri ntụkwasị obi megide anyị, ma ọ bụrụ na anyị emeghị dịka ihe niile ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị gwara gị ka ị gwa anyị. [6] Ọ bụ ihe Chineke, onye anyị na-eziga gị ka ị jụta ase, kwuru ka anyị ga-eme. Ma ọ dị mma, ma ọ dị njọ. Anyị ga-erubere ONYENWE ANYỊ Chineke gị isi, ka ihe gaara anyị nke ọma.” [7] Mgbe ụbọchị iri gasịrị okwu ONYENWE ANYỊ ruru Jeremaya ntị. [8] Nʼihi ya ọ kpọrọ Johanan nwa Kariya, ndịisi agha ya na ha so na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu. [9] Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu sị ha, “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel, onye unu zigara m ka m wegara arịrịọ unu, sịrị: [10] ‘Ọ bụrụ na unu anọgide nʼala a, aga m ewuli unu elu; agaghị m akwada unu. Aga m akụkwa unu dịka osisi, gharakwa ihopu unu. Nʼihi na ihe ọjọọ ahụ m mere ka ọ bịakwasị unu na-ewute m nke ukwuu. [11] Unu atụla eze Babilọn egwu, bụ onye unu na-atụ egwu ya ugbu a. Unu atụla ya egwu, otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, nʼihi na anọnyeere m unu, aga m azọpụta unu, napụtakwa unu site nʼaka ya. [12] Aga m enwe obi ebere nʼebe unu nọ, si otu a mee ka ya onwe ya nweekwa obi ebere nʼebe unu nọ. Ọ ga-emekwa ka unu nwetaghachikwa ala unu.’ [13] “Ma ọ bụrụ na unu onwe unu asị, ‘Anyị agaghị anọgide nʼala a,’ si otu a nupu isi nʼebe ONYENWE ANYỊ Chineke unu nọ; [14] ọ bụrụkwa na unu asị, ‘Mba, anyị ga-aga biri nʼala Ijipt ebe anyị na-agaghị ahụ agha, maọbụ nụ ụda opi ike, maọbụ nọọ agụụ nʼihi enweghị ihe oriri,’ [15] mgbe ahụ, nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ, unu ndị fọdụrụ na Juda. Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu anọgidesie ike na mkpebi unu ịga Ijipt ibiri nʼebe ahụ, ọ bụrụkwa na unu agaa biri nʼIjipt nʼeziokwu, [16] mgbe ahụ, mma agha ahụ unu na-atụ egwu ga-eru unu nʼahụ, ụnwụ ahụ unu na-atụ oke egwu ya ga-esoro unu baa nʼIjipt. Unu ga-anwụkwa nʼebe ahụ. [17] Nʼezie, ndị ahụ niile kpebiri ịga biri nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, na site nʼụnwụ, na site nʼọrịa na-efe efe. O nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ, o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-agbanarị ihe ọjọọ ahụ m ga-eme ka ọ bịakwasị ha.’ [18] Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Dịka iwe m na ọnụma m bụ ihe awụkwasịrị nʼelu ndị bi na Jerusalem, otu a ka m ga-esi wụkwasịkwa unu ọnụma m, mgbe unu ga-aga Ijipt. Unu ga-aghọ ihe ọbụbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe nkọcha na ihe ịta ụta. Unu agakwaghị ahụ ebe a anya ọzọ.’ [19] “Unu bụ ndị fọdụrụ na Juda, lee na ONYENWE ANYỊ agwala unu sị, ‘Unu agala Ijipt.’ Matanụ nke ọma na m adọọla unu aka na ntị, [20] na unu mehiere nʼobi unu mgbe unu ziri m sị m jụta ONYENWE ANYỊ Chineke unu ase. Mgbe ahụ, unu rịọrọ m sị m, ‘Rịọrọ anyị ONYENWE ANYỊ Chineke anyị arịrịọ, gwa anyị ihe niile o kwuru, anyị ga-emekwa ya.’ [21] Agwala m unu taa ihe o kwuru, ma unu ajụla ime ihe ahụ niile ONYENWE ANYỊ Chineke unu, bụ onye unu zigara m ka m jekwuru, kwuru. [22] Ya mere, matanụ ya nke ọma taa na unu ga-anwụ site na mma agha, na site nʼụnwụ, na site nʼọrịa na-efe efe, nʼebe ahụ unu chọrọ ịga biri.”
