Jeremaya 20:1-18 BIU
[1] Mgbe Pashua nwa Imea, bụ onye nchụaja, ma burukwa onyeisi na-elekọta ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, nụrụ amụma ndị a Jeremaya na-ebu, [2] o nyere iwu ka e tie Jeremaya, bụ onye amụma ihe, kee ya agbụ, tinye ya nʼọnụ ụzọ ama Dị Elu nke Benjamin, nke dị ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ. [3] Nʼechi ya, mgbe Pashua tọpụrụ ya site nʼagbụ ahụ, Jeremaya sịrị ya, “ONYENWE ANYỊ akpọghị gị Pashua, kama aha gị bụ Mago-Misabib, nke pụtara, Nwoke ihe egwu gbara gburugburu. [4] Nʼihi na nke a ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu, ‘Aga m eme ka ị ghọọrọ onwe gị, ghọọkwara ndị enyi gị niile ihe egwu. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ ha mgbe mma agha ndị iro ha ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-eburu ndị niile bi nʼime ya gaa Babilọn. Ọ ga-egbu ndị fọdụrụ. [5] Aga m enyefe ndị iro ha akụ niile dị nʼobodo, na ihe niile ha rụpụtara, na ihe niile dị oke ọnụahịa, na ngwongwo na akụ niile nke ndị eze Juda. Ha ga-eburu ya dịka ihe a kwatara nʼagha laa Babilọn. [6] Ma gị onwe gị bụ Pashua, na ndị niile bi nʼụlọ gị, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa Babilọn. Nʼebe ahụ ka ị ga-anwụ. Ebe ahụ kwa ka a ga-eli gị, gị na ndị enyi gị ndị a niile ị na-eburu amụma ụgha.’ ” [7] ONYENWE ANYỊ, ị ghọọla m aghụghọ, meekwa m ka m ghọọ onye a ghọgburu nʼaghụghọ. I jidesiela m aka ike, mee ka uche gị mezuo m nʼahụ. Lee na mmadụ niile na-akparị m ụbọchị niile. Onye ọbụla jikwa m na-eme ihe ọchị. [8] Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu. Aga m akpọ mkpu banyere ihe ike na ịla nʼiyi. Nʼihi na okwu ONYENWE ANYỊ ewetarala m mkparị na ịkwa emo ụbọchị niile. [9] Ọ bụrụkwa na m ekwuo nʼobi m sị, “Agaghị m ekwute ihe ọbụla metụtara okwu ya maọbụ aha ya ọzọ.” Ọ dịghị ekwe m. Nʼihi na okwu ya na-enwu m ọkụ nʼobi. Ọ dịkwa ka ọkụ na-enwu enwu emechibidoro ụzọ nʼime ọkpụkpụ m. Ike agwụla m ịnagide okpomọkụ nke okwu ya. Nʼezie, apụghịkwa m ịnagide ya. [10] Ana m anụ ọtụtụ akụkọ nzuzo, “Oke egwu nʼakụkụ niile! Jụụnụ ya! Ka anyị jụụnụ ya!” Ndị enyi m niile nọ na-eche mgbe m ga-azọhie ụkwụ daa, na-asị, “Ma eleghị anya ọ ga-abụ onye eduhiere, mgbe ahụ, anyị ga-emegide ya, bọọrọ onwe anyị ọbọ nʼahụ ya.” [11] Ma ONYENWE ANYỊ nọnyeere m dịka dike nʼagha; nʼihi ya, ndị na-esogbu m ga-asọ ngọngọ, ha agaghị emerikwa m. Ihe ha zubere agaghị emezuru ha, nʼihi ya, ihere ga-eme ha nke ukwuu; a gaghị echezọkwa ọnọdụ ihere ha ruo ebighị ebi. [12] Ma gị, ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, gị, onye na-enyocha onye ezi omume, onye anya ya na-eru nʼihe dị mmadụ nʼobi na nʼime echiche uche ya, biko, kwere ka m dị ndụ hụ mgbe ị ga-abọrọ onwe gị ọbọ megide ha, nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m tinyere ihe niile gbasara m. [13] Bụkuonụ ONYENWE ANYỊ abụ! Nyenụ ONYENWE ANYỊ otuto! Nʼihi na ọ na-anapụta ndụ ndị mkpa na-akpa, site nʼaka ndị ajọ omume. [14] Ihe a bụrụ ọnụ ka ụbọchị ahụ a mụrụ m bụ. Ka ụbọchị nne m mụrụ m ghara inwe ngọzị. [15] Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke wetara nna m akụkọ ọmụmụ m, nke mere ka ọ ṅụrịa ọṅụ, na-asị ya, “A mụọlara gị nwa, ọ bụ nwa nwoke!” [16] Ka e meekwa nwoke ahụ ihe ONYENWE ANYỊ mere obodo ndị ahụ o bibiri na-enweghị ọmịiko. Ka nwoke ahụ nọgidekwa na-anụ iti mkpu akwa nʼụtụtụ, na akwa ibu agha nʼehihie. [17] Nʼihi na ọ hapụrụ igbu m mgbe m nọ nʼafọ nne m, hapụ ime ka afọ nne m bụrụ ili m, ka afọ ya bụrụkwa ihe buru ibu ruo mgbe ebighị ebi. [18] Nʼihi gịnị ka m ji site nʼafọ nne m pụta ịhụ ọnọdụ ọjọọ ndị a, na ịnọgide nʼobi mwute, na ịnọ ọnọdụ ihere ogologo ụbọchị niile nke ndụ m?
