Jenesis 38:1-30 BIU

[1] Nʼoge ahụ, Juda hapụrụ ụmụnne ya gaa binyere otu nwoke onye Adulam a na-akpọ Hira. [2] Nʼebe ahụ, Juda hụrụ otu nwaagbọghọ, nwa otu nwoke onye Kenan, aha ya bụ Shua. Ọ lụrụ ya ma bakwuru ya. [3] Ọ tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye Juda gụrụ aha Ịa [4] Nwunye ya dịkwara ime ọzọ mụta nwa nwoke nke ya bụ nwunye ya gụrụ Onan. [5] Ọ mụkwara nwa nwoke ọzọ, onye ọ kpọrọ Shela. Ọ bụ na Kezib ka ọ mụrụ ya. [6] Juda lụtaara Ịa, ọkpara ya, nwunye onye aha ya bụ Tama. [7] Ma nʼihi na Ịa, ọkpara Juda, dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. ONYENWE ANYỊ gburu ya. [8] Mgbe ahụ, Juda sịrị Onan, “Bakwuru nwunye nwanne gị ka ịkuchie ya, ka i si otu a wulite mkpụrụ maka nwanne gị.” [9] Onan ma na mkpụrụ a agaghị abụ nke ya. Nʼihi ya, mgbe ọbụla ọ bakwuru nwunye nwanne ya, ọ na-anyụsa mkpụrụ nwa ya nʼala, ime ka ọ ghara inye nwanne ya nwoke nwa. [10] Ma ihe a o mere jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. Nʼihi ya ONYENWE ANYỊ gbukwara ya. [11] Juda sịrị nwunye nwa ya, bụ Tama, “Laa nʼụlọ nna gị nọrọ dịka nwanyị di ya nwụrụ tutu Shela nwa m nwoke etoo.” Ma echiche ya bụ, “ka ọ ghara ịnwụ dịka ụmụnne ya.” Tama lara gaa biri nʼụlọ nna ya. [12] Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nwunye Juda nwa Shua nwụrụ. Mgbe oge nkasiobi ya gasịrị, Juda jere Timna, ya na enyi ya Hira, onye Adulam, ilekọta ndị na-akpụchapụ igwe ewu na atụrụ ya ajị. [13] A gwara Tama sị ya, “Nna di gị na-aga Timna ịkpacha atụrụ ya ajị.” [14] O yipụrụ uwe mkpe ya, were akwa mkpuchi kpuchie onwe ya gaa nọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama Enayim, nke dị nʼụzọ e si aga Timna. O mere otu a nʼihi na ọ matara na Shela etoola, ma enyeghị ya ka ọ bụrụ nwunye ya. [15] Mgbe Juda hụrụ ya, o chere na ọ bụ otu nwanyị akwụna, ebe ọ bụ na o kpuchiri ihu ya. [16] Ma ebe ọ mataghị na ọ bụ nwunye nwa ya, o jekwuru ya ebe ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ sị ya, “Bịa, kwere ka mụ na gị dinaa.” Tama jụrụ, “Gịnị ka ị ga-enye m ma ọ bụrụ na m kwere ka mụ na gị dinaa?” [17] Ọ zara, “Aga m ezitere gị otu nwa ewu site nʼigwe ewu na atụrụ m.” Ọ jụrụ, “Ị ga-enye m ihe akaebe ruo mgbe ị ga-ezite ya?” [18] Ọ sịrị, “Kedụ ihe akaebe m ga-enye gị?” Ọ zara, “Mgbaaka akara gị na eriri ya, na mkpanaka dị gị nʼaka.” O nyere ya ihe ndị a. Ọ bakwuru ya nke mere na ọ tụụrụ ime. [19] Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o yipụrụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya, yirikwa uwe mkpe ya. [20] Mgbe Juda zigara enyi ya onye Adulam ka ọ gaa wegara ya nwa ewu ahụ, ma nataghachi ihe ibe ahụ, ọ hụghị ya. [21] Ọ jụrụ ndị ikom bi nʼebe ahụ sị, “Olee nwanyị akwụna ụlọ arụsị ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama Enayim?” Ha sịrị, “O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.” [22] Ya mere, ọ laghachiri gaa gwa Juda, “Ahụghị m ya. Ọzọkwa, ndị ikom ndị bi nʼebe ahụ sịrị, ‘O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.’ ” [23] Juda zara, “Ka o jide ihe niile o ji, ma ọ bụghị otu a anyị ga-aghọ ihe ọchị. Lee, ezigarala m ya nwa ewu a, ma gị onwe gị achọtaghị ya.” [24] Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ozi ruru Juda ntị sị, “Tama nwunye nwa gị gbara akwụna, bịa site nʼịgba akwụna dịrị ime.” Juda sịrị, “Kpọpụtanụ ya ka akpọọ ya ọkụ.” [25] Ma mgbe ha kpọ ya na-apụta, o zigara nna di ya ozi, sị, “Ọ bụ nwoke nwee ihe ndị a tụwara m ime. Ọ sịkwara, Leruo anya ma ị ga-amata onye nwe ihe ndị a: mgbaaka akara a na eriri ya, na mkpanaka a.” [26] Juda ghọtara ha, sị, “Ọ bụ onye ezi omume karịa m, ebe ọ bụ na m jụrụ ịkpọrọ ya kpọnye nwa m nwoke Shela ka ọ bụrụ nwunye ya.” O dinakwaghị ya ọzọ. [27] Mgbe oge ọmụmụ nwa ya ruru, ejima ka ahụrụ nʼakpanwa ya. [28] Mgbe ọ na-amụ ha, otu nʼime ha sepụtara aka ya. Nwanyị na-aghọ nwa weere eriri na-acha uhie uhie kee ya na nkwoji aka kwuo sị, “Ọ bụ nke a bụ ụzọ pụta.” [29] Ma nwa ahụ mesịrị sekpuo aka ya, nwanne ya nke ọzọ eburu ya ụzọ pụta. Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ otu a ka ị si tikapụta?” A kpọrọ ya Perez. [30] Emesịa, nwanne ya, nke bu eriri uhie uhie ahụ na nkwoji aka pụtakwara. A kpọrọ ya Zera.

About this translation

Life Bible app icon
Get the Life Bible app Read offline, sync highlights and notes, and study with your library on any device.