Jenesis 37:1-36 BIU
[1] Jekọb bigidere nʼala Kenan, ala ahụ nna ya buru ụzọ biri nʼime ya. [2] Nke a bụ usoro akụkọ banyere ezinaụlọ Jekọb. Josef, onye gbarala afọ iri na asaa, na-esonyere ụmụnne ya ndị ikom na-azụ igwe anụ ụlọ, ya onwe ya bụ naanị nwantakịrị na-enyere ụmụ Bilha na ụmụ Zilpa ndị nwunye nna ya aka. Ma Josef na-ewetara nna ha akụkọ maka ihe ọjọọ ha na-eme. [3] Ma Izrel hụrụ Josef nʼanya karịa ụmụ ya ndị ikom ndị ọzọ niile nʼihi na Josef bụ nwa a mụụrụ ya nʼoge agadi ya. Ọ kwaara ya uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa. [4] Mgbe ụmụnne ya chọpụtara na nna ha hụrụ ya nʼanya karịa onye ọbụla nʼime ha, ha kpọrọ ya asị, ha adịghị agwakwa ya okwu ọma. [5] Otu oge, Josef rọrọ nrọ, mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya nrọ a ọ rọrọ, ha kpọrọ ya asị karịa. [6] Ọ gwara ha, “Geenụ ntị na nrọ a m rọrọ. [7] Anyị niile nọ nʼubi na-achịkọta ọka, ngwangwa ukwu ọka nke m biliri guzoro ọtọ, ebe ukwu ọka nke unu niile gbara ukwu ọka nke m gburugburu, na-akpọ isiala nye ya.” [8] Ụmụnne ya jụrụ ya, “Ị na-akọwa na ọ bụ gị ga-abụ eze anyị? Na ọ bụ gị nʼezie ga-achị anyị?” Ha kpọrọ ya asị karịa nʼihi nrọ ya na okwu ya niile. [9] Josef rọkwara nrọ ọzọ, kọkwara ụmụnne ya. Ọ sịrị, “Geenụ ntị, arọrọ m nrọ ọzọ. Ma na nrọ nke ugbu a, anyanwụ na ọnwa na kpakpando iri na otu na-akpọ isiala nye m.” [10] Ma mgbe ọ kọọrọ nna ya na ụmụnne ya nrọ a. Nna ya baara ya mba, sị, “Nrọ nke a ị rọrọ bụ nrọ gịnị? Ọ bụ ezie na anyị niile, mụ onwe m na nne gị na ụmụnne gị, ga-abịa na-akpọrọ gị isiala?” [11] Ụmụnne ya kwosiri ya ekworo nʼihi ya, ma nna ya debere ihe ndị a niile nʼobi ya. [12] Ka ọ dị, ụmụnne ya gara ilekọta igwe anụ ụlọ nna ha na Shekem. [13] Izrel sịrị Josef, “Dịka ị maara, ụmụnne gị nọ na-eche anụ ụlọ na Shekem. Bịa, aga m eziga gị nʼebe ahụ.” Josef zara sị, “Ọ dị mma.” [14] Ya mere, ọ gwara ya, “Gaa ka ị chọpụta ma ihe ọ na-agazikwara ụmụnne gị na igwe anụ ụlọ ndị ahụ nke ọma, ma weghachiri m ozi.” O sitere na Ndagwurugwu Hebrọn zipụ ya. Ọ bịaruru Shekem, [15] ma otu nwoke hụrụ ya ka ọ na-awagharị gburugburu nʼọhịa dị nʼebe ahụ, ọ jụrụ ya, “Gịnị ka ị na-achọ?” [16] Ọ sịrị, “Ana m achọ ụmụnne m. Biko, ị nwere ike ịgwa m ebe ha nọ na-azụ igwe anụ ụlọ ha?” [17] Nwoke ahụ zara sị, “Ha esitela nʼebe a pụọ. Anụrụ m ka ha na-asị, ‘Ka anyị gaa Dọtan.’ ” Ya mere, Josef gawara Dọtan ịchọ ụmụnne ya. Ọ hụkwara ha nʼebe dị nso na Dọtan. [18] Ma ha lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya. [19] Ha sịrịtara onwe ha, “Lee eze nrọ ahụ ka ọ na-abịa! [20] Ugbu a, bịanụ, ka anyị gbuo ya, tụba ya nʼime otu olulu ndị a. Anyị ga-asịkwa na anụ ọhịa eriela ya. Mgbe ahụ, anyị ga-ahụkwa ihe nrọ ya niile ga-abụ.” [21] Ruben nụrụ ihe a, ma napụtakwa ya site nʼaka ha. Ọ sịrị, “Ka anyị hapụ igbu ya.” [22] Ruben sịrị ha, “Ka unu hapụ ịkwafu ọbara. Kama tụnyenụ ya nʼime olulu a dị nʼọzara. Ma unu akpatụkwala ya aka.” Ma nzube ya bụ ịnapụta ya site nʼaka ha, dulaara ya nna ya. [23] Ya mere, mgbe Josef bịakwutere ụmụnne ya, ha yipụrụ ya uwe mwụda ya, uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa o yi nʼahụ. [24] Ha duru ya tụnye ya nʼime olulu. Ọ bụ olulu tọgbọrọ nʼefu, nke mmiri na-adịghị nʼime ya. [25] Mgbe ha nọdụrụ ala bido iri nri, ha leliri anya ha hụ igwe ndị ahịa Ishmel si Gilead. Ịnyịnya kamel ha bu ụda na mgbaa na máá. Ọ bụkwa Ijipt ka ha bu ihe ndị a na-aga. [26] Mgbe ahụ, Juda jụrụ ụmụnne ya, “Uru gịnị ka ọ ga-abara anyị igbu nwanne anyị, ma kpuchie ọbara ya? [27] Bịanụ, ka anyị resi ya ndị Ishmel ndị a, ka aka anyị ghara nʼimetụ ya, nʼihi na nwanne anyị na otu anụ ahụ anyị ka ọ bụ.” Ụmụnne ya gere ya ntị. [28] Mgbe ndị ahịa Midia ahụ rutere, ha sitere nʼolulu dọpụta Josef resi ya ndị Ishmel ahụ, ndị kwụrụ ụmụnne Josef iri mkpụrụ shekel ọlaọcha abụọ. Ha duuru Josef gaa Ijipt. [29] Ruben mechara lọghachi gaa nʼolulu ahụ, ma ka ọ na-ahụghị Josef nʼime olulu a, ọ dọwara uwe ya. [30] O jekwuru ụmụnne ya sị ha, “Nwata ahụ anọkwaghị ebe ahụ! Mụ onwe m, olee ebe m ga-ala?” [31] Ụmụnne ya gburu otu ewu were uwe Josef bịanye nʼime ọbara ya. [32] Ha chịịrị uwe mwụda ahụ nwere ọtụtụ agwa jekwuru nna ha sị ya, “Anyị hụrụ uwe a nʼime ọhịa. Leruo ya anya ka ị mara maọbụ uwe mwụda nwa gị.” [33] Ọ matara na ọ bụ ya, sị, “E, nke a bụ uwe nwa m nwoke. Ajọ anụ eriela ya. Anụ ọhịa adọkasịala Josef nʼezie.” [34] Mgbe ahụ, Jekọb dọwara uwe ya, yiri akwa mkpe, ruo ụjụ ọtụtụ ụbọchị nʼihi nwa ya. [35] Ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom niile bịara ịkasị ya obi, ma ọ jụrụ ịnabata nkasiobi ọbụla. Ọ sịrị, “Aga m alakwuru nwa m nʼala mmụọ site nʼiru ụjụ.” Nna ya kwagidere akwa nʼihi ya. [36] Ugbu a, ndị Midia ahụ rere Josef nʼIjipt, resi ya Pọtifa, otu nʼime ndịisi na-ejere Fero ozi, onye bụ onyeisi ndị nche Fero, bụ eze Ijipt.
