Jenesis 32:1-32 BIU
[1] Jekọb nʼonwe ya hapụrụ gawa nʼihu nʼije ya. Ndị mmụọ ozi Chineke zutere ya nʼụzọ. [2] Mgbe Jekọb hụrụ ha, o kwuru sị, “Ebe a bụ ụlọ ikwu Chineke!” Ọ kpọrọ ebe ahụ, Mahanaim. [3] Mgbe ahụ, Jekọb zipụrụ ndị ozi ka ha jee hụ Ịsọ nwanne ya nwoke nʼala Sia, nʼobodo Edọm. [4] O ziri ha ozi sị, “Ihe a bụ ihe unu ga-agwa nna m ukwu Ịsọ, ‘Odibo gị Jekọb kwuru sị, Ọ bụ na nke Leban ka m jere kemgbe, ọ bụkwa ebe ahụ ka m nọ ruo ugbu a. [5] Enwere m ọtụtụ ehi, na ịnyịnya ibu, na igwe atụrụ na ewu, na ndị odibo ndị nwoke na ndị nwanyị. Ana m ezigara onyenwe m ozi a ka m nata ihuọma nʼebe ọ nọ.’ ” [6] Mgbe ndị ozi ahụ lọghachikwutere Jekọb, ha gwara ya sị ya, “Anyị jekwuru nwanne gị nwoke Ịsọ dị ka i ziri anyị. Ugbu a, ọ na-abịa. Ọ chị narị ndị ikom anọ na-abịa izute gị.” [7] Ụjọ tụrụ Jekọb nke ukwuu, obi ya jupụtakwara na nsogbu. Nʼihi nke a, o kewara ndị niile so ya ụzọ abụọ, tinyere anụ ụlọ ya, na igwe ehi ya na ịnyịnya kamel ya. [8] O chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na Ịsọ alụso otu nʼime ụzọ abụọ a ọgụ, otu ụzọ fọdụrụ ga-enwe ike gbalaga.” [9] Mgbe ahụ, Jekọb kpere ekpere sị, “Chineke nke nna m Ebraham, Chineke nke nna m Aịzik, ONYENWE ANYỊ, gị onye gwara m sị, ‘Laghachi nʼala gị na nʼebe ụmụnna gị nọ, aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma.’ [10] Ekwesighị m obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi nke i gosiri ohu gị. Mgbe m gabigara Jọdan a, enweghị m ihe ọbụla karịa mkpanaka m, ma ugbu a, abụ m ọmụma ụlọ ikwu abụọ. [11] Zọpụta m, arịọ m gị, site nʼaka nwanne m Ịsọ, nʼihi na egwu na-atụ m na ọ ga-abịa lụso m agha, lụsokwa ndị nne a na ụmụntakịrị ha agha. [12] Ọ bụ gị kwuru sị, ‘Aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma, meekwa ka ụmụ ụmụ gị dịrị ka aja nke dị nʼọnụ osimiri, nke mmadụ na-apụghị ịgụta ọnụ.’ ” [13] Jekọb rahụrụ nʼebe ahụ nʼabalị ahụ. Site nʼihe niile o nwere, ọ họpụtara onyinye ọ ga-enye nwanne ya Ịsọ. [14] Ọ kwadoro inye ya: narị nne ewu abụọ (200), iri mkpi abụọ (20), narị nne atụrụ abụọ (200), iri ebule abụọ (20) [15] Iri nne ịnyịnya kamel atọ (30) na ụmụ ha, na iri nne ehi anọ (40), oke ehi iri (10), iri nne ịnyịnya ibu abụọ (20), oke ịnyịnya ibu iri (10). [16] O weere onyinye ndị a niile nyefee nʼaka ndị ozi ya nʼusoro dịka ụdị ha si dị. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị ha, “Burunu ụzọ na-aga, meenụ ka ohere dị nʼetiti igwe anụ na igwe ibe ya.” [17] O nyere onye mbụ iwu sị ha, “Mgbe Ịsọ nwanne m zutere unu jụọ unu ajụjụ sị, ‘Onye bụ nna unu ukwu? Ebee ka unu na-aga? Onye nwe anụ ụlọ ndị a niile unu chị na-aga?’ [18] Unu ga-aza sị ya, ‘Anụ ụlọ ndị a bụ nke ohu gị Jekọb. Ha bụ onyinye e zitere onyenwe m Ịsọ, lee ka ọ na-abịa nʼazụ anyị.’ ” [19] Otu ozi ahụ ka Jekọb ziri onye nke abụọ na onye nke atọ, na ndị ọzọ niile chị igwe anụ ụlọ, sị ha, “Unu ga-agwa Ịsọ otu ihe ahụ mgbe unu zutere ya. [20] Hụkwanụ na unu gwara ya sị, ‘Ohu gị Jekọb nọ nʼazụ anyị.’ ” Echiche ya bụ, “Aga m eji onyinye ndị a niile m na-ezipụrụ ya mee ka obi ya dajụọ, nke ọ ga-abụ mgbe mụ na ya zutere, ma eleghị anya, ọ ga-anabata m.” [21] Mgbe o zipụchasịrị onyinye ndị ahụ niile, Jekọb rahụrụ ụra nʼụlọ ikwu ya nʼabalị ahụ. [22] Nʼabalị ahụ, Jekọb biliri duru ndị nwunye ya abụọ na ndị odibo nwanyị ya abụọ, na ụmụ ya iri na otu, site nʼebe na-adịghị omimi nke iyi Jabọk kpọfee ha. [23] Mgbe ọ kpọfechara ha, o bufekwara ihe niile o nwere. [24] Emesịa, Jekọb lọghachiri nọdụ naanị ya. Mgbe ahụ, otu nwoke bịara gbaso ya mgba. Ha abụọ gbagidere mgba a tutu chi ebido ịbọ. [25] Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọ pụghị imeri Jekọb na mgba ahụ, o tiri Jekọb aka nʼọkpụ, mee ka ọkpụ ya hịkwapụ site nʼọnọdụ ya. [26] Mgbe nke a mesịrị, nwoke ahụ gwara Jekọb sị ya: “Hapụ m aka ka m laa, nʼihi na chi ebidola ịbọ.” Ma Jekọb zara sị ya, “Ọ bụ naanị mgbe ị gọziri m ka m ga-ahapụ gị ka ị laa.” [27] Mgbe ahụ nwoke ahụ jụrụ Jekọb ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ aha gị?” Ọ zara sị, “Aha m bụ Jekọb.” [28] Nwoke ahụ zara sị ya, “Aha gị agaghị abụkwa Jekọb, kama ọ ga-abụ Izrel, nʼihi na gị na Chineke na ndị mmadụ gbara mgba, ị mmeri.” [29] Jekọb sịrị, “Biko gwa m aha gị.” Ma ọ zaghachiri, “Gịnị mere ị ji ajụ aha m?” Mgbe ahụ, ọ gọziri ya nʼebe ahụ. [30] Jekọb kpọrọ aha ebe ahụ Peniel, nʼihi na ọ sịrị, “Ahụla m Chineke ihu na ihu, ma e chebere ndụ m.” [31] Anyanwụ awaala mgbe Jekọb si Peniel gafee. Ma nʼihi ihe mere ya nʼọkpụ, ọ naghị agazikwa ije. [32] Ọ bụ ihe a mere ụmụ Izrel adịghị eri akwara anụ jikọtara ukwu anụ na ọkpụ ya ruo taa. Nʼihi na ihe ahụ mere Jekọb metụtara akwara ukwu ya.
