Jenesis 31:1-55 BIU
[1] Jekọb nụrụ na ụmụ ndị ikom Leban na-asị, “Jekọb ewerechaala ihe niile nna anyị nwere. O sitere nʼihe nna anyị nwere kpata akụnụba ya niile.” [2] Jekọb hụkwara na omume Leban nʼebe ọ nọ adịghịkwa otu ọ dị na mbụ. [3] Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ sịrị Jekọb, “Laghachi nʼala nna gị ha, lakwuru ụmụnna gị, aga m anọnyere gị.” [4] Ya mere, Jekọb ziri Rechel na Lịa ozi ka ha bịakwute ya nʼọhịa ebe ọ nọ na-elekọta igwe anụ ụlọ ya. [5] Ọ sịrị ha, “Ahụla m na omume nna unu nʼebe m nọ adịghịkwa otu ọ dị na mbụ. Ma Chineke nna m ha nọnyeere m. [6] Unu maara na eji m ike m niile rụọra nna unu ọrụ. [7] Ma nna unu ghọgburu m, gbanwee ụgwọ ọrụ m ugboro iri. Otu ọ dị, Chineke ekweghị ka nna unu merụọ m ahụ. [8] Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ndị tụrụ agwa agwa ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ mgbe ahụ, igwe anụ ụlọ niile na-amụ ụmụ na-abụ ndị tụrụ agwa. Ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ndị niile nwere ntụpọ ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ mgbe ahụ, igwe anụ ụlọ niile na-amụ ụmụ na-enwe ntụpọ ọcha nʼahụ ha. [9] Chineke napụrụ nna unu anụ ụlọ ya ma nye m ha. [10] “Nʼoge ụmụ anụ ụlọ ji atụ ime, eweliri m anya hụ na nrọ na ụmụ mkpi niile na-agba igwe nne ewu bụ ụmụ mkpi ndị tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha nʼahụ ha. [11] Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke sịrị m na nrọ, ‘Jekọb.’ Azara m sị, ‘Lee m nʼebe a.’ [12] Ọ sịrị m, ‘Lelie anya gị elu, lee ka ị hụ na mkpi niile na-agba igwe nne ewu ndị a bụ mkpi ndị ahụ tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha. Nʼihi na ahụla m ihe niile Leban na-eme gị. [13] Mụ onwe m bụ Chineke nke Betel, ebe ị wụkwasịrị mmanụ nʼogidi nkume ahụ, ebe ị kwekwara m nkwa. Ugbu a, kulie, hapụ obodo a, laghachi nʼala a nọ mụọ gị.’ ” [14] Rechel na Lịa zara sị ya, “Anyị ka nwere oke nʼihe nketa nʼụlọ nna anyị? [15] Ọ bụghị dịka ndị ọbịa ka ọ gụnyeziri anyị? Nʼihi na o reela anyị, ripịakwa ụgwọ isi anyị. [16] Nʼezie, akụ ndị ahụ Chineke napụrụ nna anyị bụ nke anyị na nke ụmụ anyị. Ya mere, mee ihe ọbụla Chineke sị gị mee.” [17] Jekọb biliri, kukwasị ụmụ ya na ndị nwunye ya nʼelu ịnyịnya kamel, [18] duru igwe anụ ụlọ ya niile, na ihe ọ kpatara na Padan Aram, lakwuru nna ya Aịzik nʼala Kenan. [19] Ka Leban gara ịkpachapụ ajị ụmụ atụrụ ya, Rechel zuuru arụsị ezinaụlọ nna ya. [20] Jekọb ghọkwara Leban onye Aram aghụghọ nʼihi na ọ gwaghị ya na ọ na-agbapụ ọsọ. [21] Ya mere, o buru ihe niile o nwere gbapụ ọsọ, gbafee iyi ukwu Yufretis, chee ihu nʼala ugwu ugwu Gilead. [22] Abalị atọ agafeelarị tupu a gwa Leban na Jekọb agbalaala. [23] O duuru ndị ikwu ya chụọ Jekọb ọsọ abalị asaa tupu ọ chụkwute ya nʼala ugwu ugwu Gilead. [24] Ma Chineke bịakwutere Leban onye Aram na nrọ nʼabalị sị ya, “Kpachapụ anya gị, hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.” [25] Jekọb amaala ụlọ ikwu ya nʼala ugwu Gilead mgbe Leban chụkwutere ya. Leban na ndị ikwu ya makwara ụlọ ikwu nke ha nʼebe ahụ. [26] Leban sịrị Jekọb, “Gịnị bụ ihe a i mere? Ị ghọgbuola m. I burula ụmụ m ndị inyom dịka ndị a dọtara nʼagha? [27] Gịnị mere i ji ghọgbuo m, zoro ezo gbapụ? Gịnị mere ị gwaghị m ka m jiri ọṅụ na ịbụ abụ nke ya na ịkpọ ụbọ akwara na iti ịgba so, zilaga gị? [28] Gịnị mere i nyeghị m ohere ka m sutu ụmụ ụmụ m na ụmụ m ndị inyom ọnụ sị ha laa nke ọma? Omume a i mere bụ omume nzuzu. [29] Enwere m ike merụọ gị ahụ ugbu a, ma Chineke nke nna gị mere ka m hụ ya anya na nrọ nʼabalị gara aga. Ọ dọrọ m aka na ntị sị m, ‘Kpachapụ anya gị hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.’ [30] Ugbu a, ị na-ala nʼihi na ọ gụrụ gị agụụ ịlaghachi nʼụlọ nna gị, ma gịnị mere i ji zuru chi m?” [31] Jekọb zara sị Leban, “Nʼihi na m tụrụ egwu, nʼihi na m chere sị na ị ga-eji ike napụ m ụmụ gị ndị inyom a. [32] Ma ọ bụrụ na ị chọta onye ọbụla ji chi gị ndị a, onye ahụ ga-anwụ. Nʼihu ndị ikwu gị ndị a, chọgharịa nʼonwe gị, lee ma ị ga-achọta ihe ọbụla bụ nke gị dị m nʼaka. Ọ bụrụ na ị chọta ya, were ya.” Ma Jekọb amaghị na Rechel zuuru chi ndị ahụ. [33] Ya mere, Leban bara nʼụlọ ikwu Jekọb, na nʼime ụlọ ikwu Lịa, na nʼime ụlọ ikwu ndị odibo nwanyị abụọ ya, ma o nweghị ihe ọ chọtara. O sitere nʼụlọ ikwu Lịa pụta baa nʼụlọ ikwu Rechel. [34] Nʼoge a, Rechel ewerela arụsị ezinaụlọ ndị ahụ tinye ha nʼime akwa e ji anọkwasị nʼelu ịnyịnya kamel nọdụ ọdụ nʼelu ya. Leban chọgharịrị ebe niile nʼime ụlọ ikwu ahụ ma ọ chọtaghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ. [35] Mgbe ahụ, Rechel gwara nna ya Leban sị, “Biko, ewela iwe nna m ukwu, nʼihi na enweghị m ike ibili ọtọ nʼihu gị. Anọ m nʼọnọdụ ndị inyom na-anọ kwa ọnwa.” Leban chọgharịrị ebe niile, ma ọ hụghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ. [36] Iwe were Jekọb megide Leban. O ji iwe jụọ Leban sị, “Gịnị bụ njehie m? Gịnị bụ mmehie m mere i ji si otu a na-achụsi m ike? [37] Ugbu a, ị chọgharịala nʼibu m niile, gịnị ka ị chọtara bụ nke gị? Wepụta ya nʼihu ndị ikwu gị na nʼihu ndị nke m, ka ha kpeere mụ na gị ikpe. [38] “Iri afọ abụọ ka mụ na gị nọrọ. O nweghị mgbe ime pụrụ ụmụ ewu na atụrụ gị; o nwekwaghị mgbe m riri ebule si nʼigwe anụ ụlọ gị. [39] O nweghị mgbe m welataara gị anụ ụlọ nke anụ ọhịa dọgburu, kama akwụrụ m ụgwọ ha. I mekwara ka m kwụghachi gị anụ ụlọ ọbụla e zuru nʼohi, maọbụ nʼehihie, maọbụ nʼabalị. [40] Nʼime oke anwụ nke ehihie ka m rụụrụ gị ọrụ. Rụọkwara gị ọrụ nʼoge oyi na-atụ, nʼabalị ụra sikwa nʼanya m pụọ. [41] Otu a ka ọ dịrị m iri afọ abụọ m jeere gị ozi. Arụrụ m gị ọrụ afọ iri na anọ maka ụmụ gị ndị inyom abụọ ndị a, afọ isii ka m lekọtara igwe ewu na atụrụ gị. Ị nọkwa nʼime ihe ndị a gbanwee ụgwọ ọrụ m ugboro iri. [42] A sị na Chineke m, Chineke Ebraham, onye ahụ a na-atụ egwu nke Aịzik, anọnyereghị m, ị gaara ezilaga m nʼaka efu, agaara m agbara aka laa. Ma Chineke ahụla ịrụsị ọrụ ike m, na nhụju anya m niile, ọ bụ ya mere o ji baara gị mba nʼabalị gara aga.” [43] Mgbe ahụ Leban zaghachiri sị Jekọb, “Ndị inyom ndị a bụ ụmụ m. Ụmụaka ndị a bụ ụmụ m. Igwe anụ ụlọ ndị a bụ nke m. Ihe ndị a niile ị na-ahụ anya bụ nke m. Olee otu m ga-esi merụọ ụmụ m, na ụmụ ụmụ m ahụ? [44] Ugbu a, bịa ka anyị gbaa ndụ mụ na gị, ka ọ bụrụ ihe ama nʼetiti anyị.” [45] Ya mere, Jekọb weere otu nkume guzo ya ọtọ dịka ogidi. [46] Jekọb gwakwara ndị so ya sị ha, “Tụtụkọta nkume.” Ha tụtụkọtara nkume wụsa ha nʼotu ebe mee ka ọ laa elu. Emesịa, ha nọdụrụ nʼakụkụ nkume ndị ahụ rie nri. [47] Leban kpọrọ nkume ndị ahụ Jega-Sahaduta, nʼasụsụ nke ya. Jekọb kpọrọ ya Galeed, nʼasụsụ nke ya. [48] Emesịa, Leban sịrị, “Ka nkume ndị a bụrụ ihe ama nʼetiti mụ na gị taa.” Nke a mere e ji kpọọ ya Galeed. [49] A kpọkwara ya Mizpa, nʼihi na Leban sịrị, “Ka ONYENWE ANYỊ bụrụ onye ga-eche mụ na gị nche ịhụ na onye ọbụla nʼime anyị debere ọgbụgba ndụ a, mgbe anyị na-anọghị ibe anyị nso. [50] Ọ bụrụ na i mee ụmụ m ndị inyom ihe ọjọọ, maọbụ lụọ ndị inyom ndị ọzọ tinyere ha, o nweghị onye nʼime anyị ga-amata, ma cheta na Chineke ga-abụ onyeama nʼetiti mụ na gị.” [51] Leban gwakwara Jekọb sị, “Lee nkume ndị a a wụsara nʼebe a na ogidi m mere ka o guzo nʼetiti mụ na gị. [52] Nkume ndị a a wụsara bụ akaebe, ogidi a bụkwa ihe ama. Agaghị m agabiga nkume ndị a a wụsara gafeeta nʼakụkụ nke gị ime gị ihe ọjọọ. Gị onwe gị agaghị agabiga nkume ndị a a wụsara na ogidi a gafeeta nʼakụkụ nke m ime m ihe ọjọọ. [53] Ka Chineke Ebraham na Chineke Nahọ, Chineke nna ha, bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị.” Ya mere Jekọb ji onye ahụ a na-atụ egwu nke nna ya Aịzik ṅụọ iyi. [54] Ọ chụrụ aja nʼala ugwu ugwu ahụ, kpọọ ndị ikwu ya niile oriri. Mgbe ha richara nri, ha rahụrụ ụra nʼebe ahụ. [55] Nʼisi ụtụtụ echi ya, Leban biliri sutu ụmụ ya ndị inyom na ụmụ ụmụ ya ọnụ. Ọ gọziri ha, hapụ ha laghachi ụlọ ha.
