Ilu 3:1-35 BIU
[1] Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị. Ma debe iwu m nʼobi gị. [2] Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ, wetakwara gị udo na ọganihu. [3] Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị, kekwasị ha nʼolu gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị. [4] Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ. [5] Tụkwasị ONYENWE ANYỊ obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị. [6] Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie. [7] A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. Tụọ ONYENWE ANYỊ egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị. [8] Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike gbaakwa ọkpụkpụ gị ume. [9] Sọpụrụ ONYENWE ANYỊ site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị, na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị. [10] Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke, ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ. [11] Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke ONYENWE ANYỊ, ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya. [12] Nʼihi na ọ bụ ndị ONYENWE ANYỊ hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba, dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba. [13] Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe, onye nwetara nghọta. [14] Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha, ọ bakwara uru karịa ọlaedo. [15] Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi, ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya. [16] Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya; nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa. [17] Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma bụrụkwa ụzọ udo. [18] Amamihe bụ osisi nke ndụ nye ndị na-ejide ya aka, e, onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike ka ihe na-agara nke ọma. [19] Ọ bụ site nʼamamihe ka ONYENWE ANYỊ ji tọọ ntọala ụwa; ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị. [20] Esitere nʼihe ọmụma ya kewaa ogbu mmiri niile, igwe ojii na-atụdakwa igirigi. [21] Nwa m nwoke, ekwela ka ihe abụọ ndị a site nʼihu gị wezuga onwe ha: amamihe na nghọta nke ime ihe dị mma nʼizuzu zuruoke, [22] nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ, ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma amara nʼolu gị. [23] Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwu maọbụ ihe mkpọbi ụkwụ. [24] Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu, ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ. [25] Ị gaghị atụ egwu ihe mbibi mberede ọbụla maọbụ tụọ egwu ịla nʼiyi nke na-abịakwasị ndị ajọ omume. [26] Nʼihi na ONYENWE ANYỊ bụ ebe ndabere gị, ọ ga-echebekwa gị. [27] Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya. [28] A sịkwala onye agbataobi gị laa, bịaghachi azụ echi mgbe i nwere ike ime ya taa. [29] Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị, nʼihi na o nwere ntụkwasị obi nʼebe ị nọ. [30] Ebola mmadụ ebubo na-enweghị isi, mgbe onye ahụ na-emeghị gị ihe ọjọọ ọbụla. [31] Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo maọbụ họrọ ụzọ ya ọbụla. [32] Nʼihi na ndị dị otu a bụ ihe arụ nʼanya ONYENWE ANYỊ, ma ọ na-emeso ndị na-eme ihe ziri ezi mmeso ọma. [33] Ọbụbụ ọnụ ONYENWE ANYỊ dị nʼụlọ ndị na-eme ajọ omume, ma ọ na-agọzi ụlọ ndị ezi omume. [34] Ndị mpako na-akwa emo ka ya onwe ya na-akwakwa emo, ma ndị dị umeala nʼobi ka ọ na-enye amara. [35] Ndị maara ihe na-enweta nsọpụrụ, ma ndị nzuzu na-enweta ihere.
