[1] Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata okwu ọnụ m niile zobekwa iwu m niile nʼime obi gị, [2] tọọ ntị gị nʼala nye amamihe, wepụta obi gị inwe nghọta. [3] E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị, [4] ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha maọbụ akụ nke zoro ezo, [5] mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke. [6] Nʼihi na ọ bụ ONYENWE ANYỊ na-enye amamihe; nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa. [7] Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu, ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke. [8] Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso, na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso. [9] Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi na ihe dị mma na ezi ụzọ niile. [10] Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ. [11] Izuzu zuruoke ga-echebe gị, nghọta ga na-eche gị nche. [12] Amamihe ga-azọpụta gị site nʼụzọ ndị mmehie, sitekwa na mmadụ ndị okwu ha jọrọ njọ, [13] ndị hapụrụ ụzọ niile ziri ezi nke Chineke na-agbaso ụzọ niile nke ọchịchịrị, [14] ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, nʼihi na mmehie ha na-atọ ha ụtọ. [15] Ihe ọbụla ha na-eme gbagọrọ agbagọ, jọọkwa njọ. [16] Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna, na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu. [17] Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ, nke chefuru ọgbụgba ndụ ọ gbara nʼihu Chineke. [18] Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọ nke na-eduba nʼọnwụ na nʼọkụ ala mmụọ. [19] Ndị ikom niile banyere nʼụlọ ha na-ala nʼiyi. Ha adịghị alọtakwa nʼokporoụzọ nke na-eduba na ndụ. [20] Nʼihi nke a, ị ga-aga ije nʼụzọ ndị ezi omume, debekwa ụkwụ gị nʼokporoụzọ niile nke ndị ezi omume, [21] nʼihi na ọ bụ naanị ndị ziri ezi ga-ebi nʼala ahụ, ndị na-enweghị ịta ụta ga-afọdụkwa nʼime ya. [22] Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ site nʼala ahụ, ọ bụkwa ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi ka a ga-ewezuga na ya.