Hosiya 1:1-11 BIU

[1] Okwu ONYENWE ANYỊ nke bịakwutere Hosiya nwa Beiri nʼoge Uzaya, na Jotam, na Ehaz, na Hezekaya, bụ ndị eze Juda, na nʼoge Jeroboam nwa Jehoash bụ eze nʼIzrel. [2] Na mmalite okwu ONYENWE ANYỊ site nʼọnụ Hosiya, ONYENWE ANYỊ gwara Hosiya sị, “Gaa lụtara onwe gị nwanyị na-akwa iko na ụmụ amụtara nʼịkwa iko, nʼihi na dịka nwanyị alụrụ alụ nʼakwa iko, ala a na-akwa iko nke ukwu site nʼịgbahapụ ONYENWE ANYỊ.” [3] Ya mere, ọ gara lụọ Goma nwa Diblaim, onye tụụrụ ime mụọra ya nwa nwoke. [4] ONYENWE ANYỊ gwara ya, “Aha ị ga-agụ nwantakịrị ahụ bụ Jezril. Nʼihi na tupu nwa oge nta agafee, aga m ata ezinaụlọ Jehu ahụhụ nʼihi ọbara ọ wụsiri na Jezril. Aga m eme ka alaeze nke ụlọ Izrel kwụsị. [5] Nʼụbọchị ahụ, aga m agbaji ụta Izrel na Ndagwurugwu Jezril.” [6] Emesịa, Goma tụụrụ ime ọzọ, mụta nwa nwanyị. Ọ gwara ya, “Aha ị ga-agụ ya bụ Lo-Ruhama, nʼihi na agaghị m enwekwa obi ebere ọzọ nʼahụ ụlọ Izrel, ịgbaghara ha mmehie ha. [7] Ma aga m enwe obi ebere nʼahụ ụlọ Juda. Mụ onwe m ga-azọpụta ha site na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke ha. Agaghị m eji ngwa agha ọbụla, dịka ụta maọbụ mma agha maọbụ ike ibu agha maọbụ ịnyịnya maọbụ ndị na-agba ịnyịnya zọpụta ha.” [8] Mgbe ọ jụrụ Lo-Ruhama ara, ọ tụụrụ ime ọzọ, mụọ nwa nwoke. [9] ONYENWE ANYỊ sịrị, “Kpọọ aha ya Lo-ammi, nke pụtara unu abụghị ndị m, nʼihi na unu abụghị ndị nke m, mụ onwe m abụkwaghị Chineke unu. [10] “Ma ọnụọgụgụ ụmụ Izrel ga-adị ka aja dị nʼọnụ oke osimiri nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ tụọ nʼihe ọtụtụ. Nʼebe ahụ a nọ sị ha, ‘Unu abụghị ndị m,’ nʼebe ahụ ka a ga-anọ sịkwa ha, ‘Ụmụ Chineke dị ndụ ka unu bụ.’ [11] A ga-achịkọtakwa ndị Juda na ndị Izrel ọnụ. Ha ga-ahọpụtakwara onwe ha otu onyeisi, si nʼala ahụ rigopụta, nʼihi ihe ukwu ka ụbọchị Jezril ga-abụ.

About this translation

Life Bible app icon
Get the Life Bible app Read offline, sync highlights and notes, and study with your library on any device.