[1] “Nʼoge ahụ, Maikel, onyeisi ọchịchị ukwuu ahụ, nke na-eche ndị unu, ga-ebili. Ọ ga-abụ oge nhụju anya, a na-ahụtụbeghị ụdị ya site na mgbe mba ọbụla malitere ruo ugbu a. Ma mgbe ahụ, ndị gị niile, ndị e dere aha ha nʼakwụkwọ ahụ, ka a ga-anapụta. [2] Igwe ndị niile nwụrụ anwụ, ndị e likwara, ha ga-ebilite. Ụfọdụ ha ga-ebili baa na ndụ ebighị ebi, ma ụfọdụ ga-ebili keta ihere na ịbụ ọnụ nke ebighị ebi. [3] Ndị ahụ bụ ndị maara ihe, ka a ga-eme ka ha nwuo ọcha dịka ihe mbara eluigwe. Ndị ahụ niile na-emekwa ka ọtụtụ si nʼihe ọjọọ mee ezi omume ga-enwukwa dịka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi. [4] Ma gị bụ Daniel, zoo okwu e dere nʼakwụkwọ a, mechiekwa ma kachiekwa ha akara tutu ruo ọgwụgwụ oge. Ọtụtụ ga-agbagharị ebe na ebe ọzọ, ma ihe ọmụma ga-aba ụba.” [5] Mgbe ahụ, mụ bụ Daniel weliri anya hụ mmadụ abụọ ndị ọzọ ka ha nọ nʼakụkụ osimiri ahụ, otu nʼakụkụ nke a, otu nʼakụkụ nke ọzọ. [6] Otu nʼime ha juru nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke guzo nʼakụkụ elu elu nke osimiri ahụ ajụjụ, sị, “Olee mgbe ihe ndị a na-eyi egwu ga-emezu?” [7] Nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke nọ nʼakụkụ elu elu mmiri nke osimiri ahụ chịlịri aka nri na aka ekpe ya elu. Anụkwara m mgbe o ji Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi, “Nʼihe ndị a ga-emezu naanị mgbe afọ atọ na ọkara gafere, tupu onye ahụ na-emebi ike nke ndị dị nsọ ga-abịa nʼisi ngwụcha ndụ ya, ihe ndị a niile ga-emezucha.” [8] Anụrụ m ma aghọtaghị m, nʼihi nke a, a sịrị m, “Biko, Onyenwe m, gịnị ka ihe ndị a ga-apụta?” [9] Ọ sịrị, “Daniel, gawara onwe gị. Nʼihi na-apịachiela okwu ndị a, kachiekwa ya akara tutu ruo nʼọgwụgwụ oge. [10] Ọtụtụ ka a ga-eme ka ha dị ọcha, sachaa ha mee ka ha dị ọcha na-enweghị ntụpọ, a ga-anụchakwa ha. Ma ndị ajọ omume ga-aga nʼihu nʼajọ omume ha. O nweghị onye ajọ omume nke ga-aghọtakwa ihe, ma ndị ahụ maara ihe ga-aghọta ihe ihe a pụtara. [11] “Site nʼoge e mechiri ịchụ aja nsure ọkụ nke a na-achụ kwa ụbọchị niile ruo nʼoge a ga-ewuli ihe arụ ahụ nke na-eweta mbibi, ga-abụ otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị itoolu. (1,290) [12] Ngọzị ga-adịrị onye ahụ nke na-echere, ma nọgidesịkwa ike ruo mgbe otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị atọ, na iri ụbọchị atọ na ise (1,335) ahụ gafere. [13] “Ma gị onwe, gawara onwe gị ruo ọgwụgwụ ihe ndị a. Ị ga-ezukwa ike, ị ga-ebilitekwa nʼoge ikpeazụ ịnara ihe nketa nke ruuru gị.”