Diuteronomi 33:1-29 BIU
[1] Nke a bụ ngọzị Mosis, onye nke Chineke, jiri gọzie ụmụ Izrel, tupu ọ nwụọ. [2] Ọ sịrị, “ONYENWE ANYỊ si nʼugwu Saịnaị bịa, ọ waliteere ha site nʼugwu Sia, o nwupụtara site nʼugwu Paran Ya na igwe ndị nsọ so bịa site nʼakụkụ ndịda, site nʼala ala ugwu ahụ. [3] Nʼezie, ọ bụ gị na-ahụ ndị mmadụ ahụ nʼanya, ndị nsọ ahụ niile dị gị nʼaka. Nʼụkwụ gị ka ha na-ada kpọọ isiala, gị na-akụziri ha ihe, [4] iwu ahụ Mosis nyere anyị, ihe onwunwe nke ọgbakọ Jekọb. [5] Ọ bụ ya bụ eze na Jeshurun, mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ ha na ebo niile nke Izrel. [6] “Ka ebo Ruben dịrị ndụ ghara ịnwụ, ma ka ọnụọgụgụ ndị ikom ya dịrị ole na ole.” [7] Ihe a ka o kwuru banyere Juda, “Nụrụ, ONYENWE ANYỊ, akwa Juda, kpọlata ya nʼebe ndị ya nọ. Aka ya ka o ji alụrụ onwe ya ọgụ ichebe ihe o bu nʼuche. Bụụrụ ya onye inyeaka megide ndị iro ya.” [8] Banyere Livayị o kwuru sị, “Urim na Tumim gị dịịrị ohu gị ahụ kwesiri ntụkwasị obi. Ị nwara ya ọnwụnwa na Masa, gị na ya sekwara okwu na mmiri Meriba. [9] Onye ahụ lere nne na nna ya anya sị, ‘Ejighị m ha kpọrọ ihe.’ Ọ gụnyeghịkwa ụmụnne ya dịka ndị ọ maara, ọ nabatakwaghị ụmụ nke aka ya. Ma o debere okwu gị, cheziekwa ọgbụgba ndụ gị. [10] Ọ na-akụziri Jekọb ikpe gị, na-akụzikwara Izrel iwu gị. Ọ na-achụkwa aja ụda na-esi isi ụtọ nʼihu gị, na-achụkwa aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja gị. [11] Gọzie akụnụba ya ONYENWE ANYỊ, ka ọrụ aka ya bụrụkwa ihe na-atọ gị ụtọ. Tijie ụkwụ ndị niile na-ebili imegide ya, tigbuo ndị iro ya ka ha ghara inwe ike ibili ọzọ.” [12] Mosis kwuru banyere ebo Benjamin sị, “Ka onye ahụ ONYENWE ANYỊ hụrụ nʼanya zuru ike na-atụghị ụjọ nʼime ya. Nʼihi na ọ ga-ekpuchi ya ogologo ụbọchị niile. Ọ bụkwa nʼetiti ubu ya abụọ ka onye ONYENWE ANYỊ hụrụ nʼanya na-anọ.” [13] Banyere Josef o kwuru sị, “Ka ONYENWE ANYỊ gọzie ala ya, ya jiri igirigi dị oke ọnụahịa nke eluigwe dị nʼelu, na ogbu mmiri dị nʼokpuru ala, [14] na ihe ọma niile anyanwụ na-eweta, na ihe ọma niile ọnwa na-ewepụta, [15] na onyinye ọma niile si nʼugwu ukwu ochie, na ịba ụba ugwu ebighị ebi ndị ahụ, [16] na onyinye ọma niile si nʼala na uju ya niile, na ihuọma onye ahụ na-ebi nʼọhịa nta ahụ na-enwu ọkụ. Ka ihe ndị a niile dịrị nʼisi Josef, nʼiku anya onye bụ nwa eze, nʼetiti ụmụnna ya. [17] Nʼịma mma, ọ dị ka nwa oke ehi e bụ ụzọ mụọ, mpi ya dị ka mpi ehi ọhịa. Ya ka ọ ga-eji sọda mba niile ọ bụladị mba ndị ahụ dị na nsọtụ ụwa. Otu a ka iri puku kwụrụ puku ndị Ifrem dị otu a ka imerime puku ndị Manase dị.” [18] Banyere Zebụlọn, o kwuru sị, “Ṅụrịa, gị Zebụlọn, nʼọpụpụ gị, ma gị Isaka, ṅụrịa nʼebe obibi gị. [19] Ha ga-akpọ ndị mmadụ oku nʼelu ugwu ukwuu, nọ nʼebe ahụ chụọ aja ezi omume, ha ga-eri site nʼịba ụba nke ihe dị nʼosimiri, site nʼakụ nzuzo dị nʼaja.” [20] Banyere Gad, o kwuru sị, “Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-eme ka ebe obibi Gad saa mbara. Gad na-ebi dịka ọdụm, na-adọkapụ aka maọbụ isi. [21] Ọ họọrọ ala nke kachasị mma nye onwe ya; oke ruuru onyendu ka e wepụrụ dobere ya. Mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ, o mezuru ezi ihe dị ONYENWE ANYỊ nʼobi, na ikpe ya niile banyere Izrel.” [22] Banyere Dan, o kwuru sị, “Dan bụ nwa ọdụm, onye na-esi na Bashan mapụta.” [23] Banyere Naftalị, o kwuru sị, “Naftalị bụ onye njupụta nke ihuọma ONYENWE ANYỊ dịrị, o jupụtakwara na ngọzị ya, ọ ga-eketa akụkụ ndịda nke iyi ukwu.” [24] Banyere Asha, o kwuru sị, “Onye a gọziri karịchasịa nʼụmụ ndị ikom ka Asha bụ, ka ihe banyere ya tọọ ụmụnna ya ụtọ, ka o jirikwa mmanụ saa ụkwụ ya. [25] Ihe mkpọchi nke ọnụ ụzọ ama gị ga-abụ bronz na igwe, dịka ụbọchị ndụ gị niile si dị, otu a ka ịdị ike gị ga-adị. [26] “O nweghị onye dịka Chineke Jeshurun, onye na-agba eluigwe dịka ịnyịnya ịbịa inyere gị aka, onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya nʼịdị ukwuu ya. [27] Chineke ebighị ebi bụ ebe mgbaba gị. Nʼokpuru gị ka aka ebighị ebi ya dị. Ọ ga-esite nʼihu gị chụpụ ndị iro gị, kwuokwa sị, ‘Bibie ha!’ [28] Ya mere Izrel ga-ebi naanị ya nʼudo, isi iyi mmiri Jekọb dị chịm, nʼala ahụ jupụtara na mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ ebe igirigi nke eluigwe na-ada. [29] Onye a gọziri agọzi ka ị bụ, gị Izrel, onye dị ka gị ndị ONYENWE ANYỊ zọpụtara? Ọ bụ ọta gị na onye inyeaka gị, na mma agha gị dị ebube. Ndị iro gị ga-eji egwu daa nʼihu gị, ị ga-azọdakwa ebe ha niile dị elu.”
