Diuteronomi 30:1-20 BIU
[1] Mgbe ihe ndị a niile ga-emezu nʼebe unu nọ, ya bụ, ngọzị niile na ọbụbụ ọnụ niile m gụpụtara nʼihu unu, ọ bụrụ na unu ga na-atụgharị uche na ha nʼetiti mba ndị ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu ga-achụba unu, [2] ọ bụrụkwa na unu ekpebie nʼobi unu nʼoge ahụ ịlọghachikwute ONYENWE ANYỊ Chineke unu, ọ bụrụ na unu, na ụmụ unu ga-eji obi unu niile na mmụọ unu niile mezuo iwu ndị a niile m nyere unu taa. [3] Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ga-anapụta unu. Ọ ga-enwe obi ebere nʼebe unu nọ kpọkọtakwa unu site na mba niile ebe ọ chụsasịrị unu. [4] A sịkwarị na ọ bụ nʼala dị na nsọtụ ụwa nʼokpuru eluigwe ka a chụgara unu, nʼebe ahụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị ga-achịkọta unu, kpọghachitekwa unu. [5] ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ga-akpọlata unu nʼala ahụ bụ nke nna nna unu ha. Unu ga-enwetakwa ya, ọ ga-eme ka ihe gara unu nke ọma, meekwa ka unu baa ụba karịa nna nna unu ha. [6] ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ga-ebi obi unu, na obi ụmụ unu, na nke ụmụ ụmụ unu ugwu, ka unu were obi unu niile na mmụọ unu niile, hụ ya nʼanya, ma dịkwa ndụ. [7] ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ga-eme ka ọbụbụ ọnụ ndị a bịakwasị ndị iro unu, ndị kpọrọ unu asị na ndị na-akpagbu unu. [8] Unu ga-emesịakwa rubere ONYENWE ANYỊ isi, gbasookwa iwu ya niile nke m na-enye unu taa. [9] Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ga-eme ka unu babiga ụba oke nʼọrụ niile nke aka unu, nʼime mkpụrụ nke afọ, nʼime mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ala ubi gị. Obi ga-atọkwa ONYENWE ANYỊ ụtọ ọzọ, ime gị ka ị baa ụba dịka ọ tọrọ ya nʼebe nna unu ha nọ. [10] Ma ọ bụrụ na unu erubere ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu isi, debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile nke e dere nʼAkwụkwọ iwu a, jirikwa obi unu niile na mmụọ unu niile bịaghachikwute ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu. [11] Idebe iwu ndị a m na-enye unu taa abụghị ọrụ sịrị ike, ọ bụkwaghị ihe karịrị unu ike ime. [12] Nʼihi na iwu ndị a adịghị nʼeluigwe nke ị ga-eji sị, “Onye ga-arịgo nʼeluigwe wedatara m ya ka m nụ ihe ọ na-ekwu, ma debekwa ya.” [13] Iwu a adịghịkwa nʼofe ọzọ nke oke osimiri, nke ị ga-eji sị, “Onye ga-agafe ga weta ya, kpọsaa ya nye anyị ka anyị nụ, ma debekwa ihe ọ na-ekwu?” [14] Mba, okwu ahụ dị gị nso, ọ dị gị nʼọnụ, dịrịkwa nʼobi gị, ka i nwee ike idebe ha. [15] Lee, edoola m nʼihu gị taa ndụ na ọganihu, ọnwụ na ịla nʼiyi. [16] Enyela m gị iwu taa, sị gị hụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị nʼanya, ana m asịkwa gị gbasoo ụzọ ya, ma debekwa iwu na ụkpụrụ ya niile, ka ị dịrị ndụ, ghọọkwa mba buru ibu, ka ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị gọzie gị nʼala ahụ ị na-aga inweta. [17] Ma ọ bụrụ na obi gị e si nʼiso ya tụgharịa, ọ bụrụkwa na ị jụ ige ntị, ọ bụrụ na a dọkpụfuo gị mee ka i fee chi ndị ọzọ ofufe ma ịkpọ isiala nye ha, [18] agwala m gị hoohaa taa, na ị ga-ala nʼiyi, ị gaghị enwe ogologo ndụ nʼala ahụ ị na-agafe osimiri Jọdan inweta. [19] Ana m akpọku eluigwe na ụwa taa ka ha bụrụ ndị akaebe m, na edebela m nʼihu gị ọnwụ na ndụ, debekwa nʼihu gị ngọzị na ọbụbụ ọnụ. Ugbu a, họrọ ndụ, ka gị na ụmụ gị dị ndụ [20] ka ị hụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị nʼanya, ṅaa ntị nʼolu ya, daberekwa na ya. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ bụ ndụ gị, ọ ga-enye gị ụbọchị ndụ gị niile nʼala ahụ o kwere nkwa ị nye nna nna gị ha Ebraham, na Aịzik, na Jekọb.
