Diuteronomi 24:1-22 BIU
[1] Ọ bụrụ na nwoke akpọrọ nwanyị, lụọ ya, ma emesịa ihe nwanyị ahụ amasịkwaghị ya nʼihi na ọ dị ihe ọ chọpụtara nʼahụ ya nke na-adịghị mma, ọ ga-ede akwụkwọ alụkwaghị m nye nwanyị ahụ nʼaka, zilaa ya. [2] Ọ bụrụ na emesịa, nwoke ọzọ alụọ ya, [3] ma nwoke ahụ ekpebiekwa ịgbara ya akwụkwọ achọkwaghị m, maọbụ na nwoke a mesịrị nwụọ, [4] nwoke mbụ ahụ lụrụ nwanyị ahụ agaghị alụ ya ọzọ, nʼihi na nwanyị a abụrụla onye rụrụ arụ nye nwoke ahụ. Ọ bụkwa arụ nʼanya ONYENWE ANYỊ ma di ya nke mbụ lụọ ya ọzọ. Ihe dị otu a ga-eweta ihe ọjọọ nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke na-enye gị dịka ihe nketa. [5] Nwoke ọbụla lụrụ nwunye ọhụrụ agaghị apụ soro ndị agha, maọbụ soro rụọ ọrụ ọzọ pụrụ iche, otu afọ ka ọ ga-enwere onwe ya ịnọ nʼụlọ ya, ya na nwunye ya, ime onwe ha obi ụtọ. [6] Mmadụ agaghị ewere nkume ịkwọ nri dịka ihe ebe, nʼihi na ọ bụ ihe onye nwe ya ji achọta nri ụbọchị ya. [7] Ọ bụrụ na onye ọbụla ezuru nwanna ya onye Izrel nʼohi, mesoo ya mmeso dịka ohu, maọbụ ree ya, onye ohi ahụ ga-anwụ. Nke a bụ ikpochapụ ihe ọjọọ nʼetiti gị. [8] Gbalịsie ike ịhụ na ị na-eso iwu niile onye nchụaja, bụ onye Livayị nyere gị banyere ndị nwere ọrịa ekpenta, nʼihi na agwala m ya usoro ha ga-agbaso. [9] Chetakwa ihe ONYENWE ANYỊ Chineke gị mere Miriam, mgbe i si nʼIjipt na-apụta. [10] Ọ bụrụ na i binye mmadụ ihe ọbụla, abanyekwala nʼụlọ ya ịnata ihe a na-enye gị dị ka ihe ebe. [11] Guzo nʼezi! Ka onye ahụ ị na-ebinye ihe wetara gị ihe ibe ahụ nʼezi. [12] Ọ bụrụ na ọ bụ onye ogbenye na-enweghị ihe, e jidela ihe ibe ya naba ụra abalị. [13] Weghachiri ya akwa ahụ nʼanyasị, ka onye agbataobi gị jiri ya hie ụra abalị. Mgbe ahụ ha ga-ekele gị, ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-agụkwara gị ya nʼezi omume. [14] Emegbula nwa ogbenye mkpa na-akpa i goro ọrụ, ma onye ahụ ọ bụ nwa Izrel ma ọ bụkwanụ onye ọbịa bi nʼobodo gị. [15] Kwụọ ya ụgwọ ya ụbọchị niile tupu anwụ adaa, nʼihi na ebe ọ bụ nwa ogbenye, obi ya dabeere nʼụgwọ ahụ ị ga-akwụ ya. Ọ bụrụ na i meghị otu a, ọ ga-akwa akwa kpọkuo ONYENWE ANYỊ megide gị. A ga-agụkwara gị ya dịka mmehie. [16] Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya. [17] Ikpe ziri ezi ga-adịrị, ọ bụladị onye ọbịa na nwa mgbei, anarakwala nwanyị di ya nwụrụ anwụ uwe ya dịka ihe ibe. [18] Cheta mgbe niile na i bụrụrị ohu nʼala Ijipt, ma ONYENWE ANYỊ Chineke gị gbapụtara gị, nʼihi nke a ka m ji enye gị iwu ndị a. [19] Ọ bụrụ na i lefuo ukwu ọka ụfọdụ anya mgbe ị na-ewe ihe ubi nʼubi gị, alaghachila azụ nʼubi gị ịchịrị ha. Hapụrụ ya ndị ọbịa, na ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei, ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-agọzi gị, ọ ga-emekwa ka ị baa ụba. [20] Mgbe ị na-akụtusi mkpụrụ osisi oliv gị, ejeghachila azụ nʼalaka ọbụla inyochazi ya, ịchọpụta ma ị ghọtachaala mkpụrụ niile mịrị nʼelu ha. Hapụrụ ndị ọbịa na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ mkpụrụ ọbụla fọdụrụ. [21] Otu a ka ị ga-emekwa nʼihe banyere mkpụrụ ubi vaịnị gị. Atụtụkọchala mkpụrụ niile mịrị nʼelu ya. Hapụrụ ndị ọbịa, na ndị mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ ihe niile fọdụrụ. [22] Chetakwa na o nwere mgbe ị bụ ndị ohu nʼala Ijipt. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji na-enye gị iwu a.
