[18] Ị gaghị ewebata nʼụlọ ONYENWE ANYỊ Chineke gị, onyinye ọbụla site nʼego nwanyị na-agba akwụna kpatara, maọbụ site nʼego nwoke ahụ na-edebe onwe ya dịka akwụna nye ndị ikom ibe ya kpatara, iji mezuo nkwa ọbụla. Nʼihi na ha abụọ bụ ihe rụrụ arụ nʼanya ONYENWE ANYỊ Chineke gị.