2 Ihe e mere 2:4 BIU

[4] Ugbu a, ana m akwado iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha ONYENWE ANYỊ Chineke m, na ido ya nsọ nye ya maka ịchụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu ya, na idebe nʼebe ahụ achịcha nsọ a na-edo nʼusoro mgbe niile. Na isure aja nsure ọkụ ụtụtụ na anyasị, na nʼụbọchị izuike niile, na nʼọnwa ọhụrụ na nʼoge mmemme ndị ọzọ niile a kara aka nke ONYENWE ANYỊ Chineke anyị. Nke a bụ ụkpụrụ na-adịgide nye ụmụ Izrel ruo ebighị ebi.

About this translation

Life Bible app icon
Get the Life Bible app ★★★★★4.8 · 217K ratings Read offline, sync highlights and notes, and study with your library on any device.