Mkpughe 18:1-24 BIU
[1] Mgbe ihe ndị a niile gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼeluigwe na-arịdata. E nyere ya ikike dị ukwuu, ebube ya mekwara ka ihe jupụta nʼụwa. [2] O ji olu dị ike tie mkpu, “ ‘Ọ daala! Ọ daala! Babilọn Obodo Ukwu ahụ adaala!’ Ọ ghọọkwala ọgba obibi ndị mmụọ ọjọọ nʼebe nzukọ mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha, nʼebe nzukọ ụmụ nnụnụ rụrụ arụ nʼebe nzukọ ụmụ anụmanụ niile na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ. [3] Nʼihi na mba niile aṅụọla site na mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya. Ndị eze nke ụwa sokwaara ya kwaa iko, ndị na-azụ ahịa nʼụwa aghọkwaala ndị ọgaranya site nʼoke ịba ụba nke ya.” [4] Mgbe ahụ, anụkwara m olu ọzọ si nʼeluigwe na-akpọ oku na-asị, “ ‘Ndị m, sinụ nʼime ya pụta,’ ka unu ghara iketa oke na mmehie ya, ka unu gharakwa iketa oke ahụhụ ya. [5] Nʼihi na mmehie ya amụbaala ruo eluigwe. Chineke echetakwala ajọ omume ya niile. [6] Mesonụ ya mmeso dịka o si meso unu. Kwụghachinụ ya ụgwọ mmaji abụọ maka ihe o mere. Gwakọọrọnụ ya mmaji abụọ nʼime iko mmanya ahụ nke ọ gwakọọrọ ndị ọzọ. [7] Nye ya ọtụtụ mmekpa ahụ na obi ilu dịka ndụ otuto, nʼime onwe ya obi ụtọ nke o nyere onwe ya. Ọ na-ekwu nʼobi ya na-asị, ‘Abụ m eze nwanyị nọ nʼelu ocheeze m. Abụghị m nwanyị di ya nwụrụ, iru ụjụ ọbụla adịghị nye m.’ [8] Nʼihi nke a, ihe ntaramahụhụ ya ga-abịakwasị ya nʼotu ụbọchị, ọnwụ na iru ụjụ nke ọnwụ na-eweta, na ụnwụ. A ga-eji ọkụ rechapụ ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye na-ekpe ya ikpe, dị ike. [9] “Ndị eze nke ụwa, ndị soro ya kwaa iko, ma bie ndụ ọchịchọ ọjọọ ya, ga-akwa akwa, ruo ụjụ nʼihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke ịkpọ ọkụ ya. [10] Ha ga-eji oke egwu guzo nʼebe dị anya, kwaa akwa nʼihi ntaramahụhụ ya sị, “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, Babilọn, Obodo ukwu a maara aha ya gị Babilọn, obodo e ji ịdị ike maara. Nʼotu ntabi anya, ikpe nke gị na-abịa.’ [11] “Ndị ahịa nke ụwa ga-akwa akwa ruokwa ụjụ nʼihi ya, nʼihi na ọ dịkwaghị onye na-azụ ihe ahịa ha ọzọ. [12] Ngwa ahịa ọlaedo gị, na ọlaọcha, na ọla e ji achọ mma na nkume oke ọnụahịa, ezi akwa ọcha, na akwa uhie uhie, na akwa lọrịlọrị, na akwa odo odo, osisi niile na-esi isi ọma, ihe niile e ji ọdụ enyi mee, ngwa ahịa niile e ji osisi niile dị oke ọnụahịa mee, bronz, igwe na nkume mabụl. [13] Ha na ụda sinamọn na mmanụ otite nke ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ, máá na frankisens, mmanya na mmanụ oliv, ụtụ ọka na wiiti, ehi na atụrụ, ịnyịnya na ụgbọala agha, na ndị na-ere mmadụ ibe ha dịka ohu, na ahụ mmadụ na mkpụrụobi mmadụ. [14] “Ha ga-asị, ‘Mkpụrụ ndị ahụ niile nke na-agụ mkpụrụobi agụ e sitela nʼebe ị nọ gabiga. Ihe ọma niile i ji ebi ndụ, na ihe oke ọnụahịa niile i ji azụ afọ gị, efunarịla gị. Apụghị ịchọtakwa ha ọzọ mgbe ọbụla.’ [15] Ndị ahịa ahụ bara ọgaranya site nʼaka ya, ga-anọ nʼebe dị anya, nʼihi oke egwu nke ntaramahụhụ ya, na-eru ụjụ, na-ebesikwa akwa ike. [16] “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu ahụ, nke e yikwasịrị ezi akwa ọcha, nke na-acha odo odo na ọbara ọbara nke nya ihe ịchọ mma nke ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche na nkume pieal dị iche iche. [17] Nʼotu awa a ka a lara oke akụ niile ndị a nʼiyi.’ “Ndị niile nwee ụgbọ na-aga nʼoke osimiri, na ndị na-akwọ ụgbọ ndị ahịa nʼoke osimiri, na ndị niile na-eso ụgbọ mmiri ga-anọ nʼebe tere anya, [18] na-eti mkpu mgbe ha ga na-ele anya na-ahụ anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼire ọkụ ya na-asị, ‘Olee obodo ọzọ dịka obodo ukwuu a?’ [19] Ha ga-ekpokwasị aja nʼisi igosi obi ọjọọ ha na-eti mkpu akwa na-asị, “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu a maara aha ya ebe ndị niile nwere ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri ghọrọ ndị ọgaranya site nʼakụ dị nʼime ya. Ma ugbu a, nʼotu ntabi anya, ihe niile dị nʼime ya bụ ihe a laara nʼiyi.’ [20] “Ma gị eluigwe, ṅụrịa ọṅụ nʼihi ihe a dakwasịrị ya, unu ndị nsọ, ṅụrịakwanụ ọnụ, unu ndị amụma na ndị ozi, ṅụrịakwanụ ọnụ. Nʼihi na Chineke ekpeela ya ikpe nʼihi mmeso ya megide unu.” [21] Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi dị ukwuu tụtụlitere otu nkume nke dịka nkume igwe nri, tụba ya nʼime oke osimiri, na-asị, “Otu a ka a ga-esi tufuo Babilọn obodo ukwu ahụ, agaghị ahụkwa ya ọzọ. [22] Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nʼebe ahụ. Agaghị anụkwa olu ọja na une na ụbọ akwara na nke ndị na-afụ opi ike nʼime gị ọzọ. Aghaghị ahụ onye ọrụ ǹka ọbụla nʼime gị ọzọ. Agaghị anụkwa ụzụ nkume igwe nri nʼime gị ọzọ. [23] Ìhè nke sitere nʼoriọna agaghị acha nʼime gị ọzọ. Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị na-alụ di na nwunye agaghị adịkwa. Ndị mgbereahịa gị bụ ndị a ma ama nʼelu ụwa, ọ bụkwa mgbaasị gị ka e ji duhie mba niile nke ụwa. [24] Nʼime ya ka a hụrụ ọbara ndị amụma niile, na nke ndị nsọ niile, na nke ndị ọzọ ahụ niile e gburu nʼụwa.”
