Maika 2:1-13 BIU

[1] Ahụhụ na-adịrị ndị na-eche ihe ọjọọ nʼobi ha, na ndị niile na-edina nʼakwa ha na-eche ajọ echiche. Mgbe chi bọrọ, ha na-arụzu ihe ha chepụtara, nʼihi na ikike imezu ya dị nʼaka ha. [2] Ha na-enwe anya ukwu nʼebe ubi ndị ọzọ dị, were ha nʼaka ike, na ụlọ dị iche iche, ha ewere ha nʼike. Ha na-ejikwa aka ike nara ndị mmadụ ụlọ ha, ha na-ezunara ha ihe nketa ha. [3] Nʼihi nke a, ONYENWE ANYỊ na-asị, “Lee, ana m akwado ihe ọjọọ megide agbụrụ a, nke unu na-enweghị ike isite na ya wezuga onwe unu. Unu agaghị eji nganga na-ejegharịkwa, nʼihi na ọ ga-abụ oge ọjọọ. [4] Nʼụbọchị ahụ ha ga-akọcha unu, ha ga-abụrụ unu abụ iru ụjụ iji ya kọchaa unu na-asị, ‘Anyị abụrụla ndị lara nʼiyi, e kesaala ihe nnweta nke ndị m, ọ napụla m ha. O werela ubi anyị nyefee ha nʼaka ndị ahụ meriri anyị nʼagha.’ ” [5] Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke ONYENWE ANYỊ, onye ga-eji ihe ọtụtụ kee ala ahụ site nʼife nza. [6] Ndị amụma ha na-asị, “Unu ebukwala amụma.” “Unu ebukwala amụma banyere ihe ndị a, ihere agaghị eme anyị.” [7] Ụdị ihe a o kwesiri okwukwu, gị ụlọ Jekọb? “Ntachiobi ONYENWE ANYỊ ọ gwụla? Ihe ndị a ọ bụ otu o si eme?” “Ọ bụ na okwu m adịghị eme onye ụzọ ya ziri ezi mma? [8] Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị m dịka ndị iro. Unu na-eyipụ ndị na-agafe agafe uwe ọma ha yi nʼahụ ha na-enweghị mmetụta, dịka a ga-asị na unu bụ ndị si nʼagha na-alọta. [9] Unu na-achụpụ ndị inyom ndị m site nʼụlọ afọ ojuju ha. Ụmụ ha ka unu na-anapụ ngọzị m ruo mgbe ebighị ebi. [10] Bilienụ, pụọnụ, nʼihi na ebe a abụkwaghị ebe izuike, nʼihi na-emerụọla ya, e bibiela ya, o bibikwaala, ruo na-ịrụzi ya agaghị adị ire. [11] Ọ bụrụ na otu onye abịa buoro unu amụma ụgha na-asị, ‘Aga m eburu unu amụma banyere mmanya na ihe ọṅụṅụ siri ike,’ ọ bụ onye amụma dị otu a ka ndị a chọrọ. [12] “Aga m achịkọta unu niile, gị Jekọb, aga m akpọkọta ndị niile fọdụrụ nʼIzrel nʼotu ebe. Aga m akpọkọta ha dịka atụrụ nʼime ọgba anụ, dịka igwe ewu na atụrụ nʼebe ịta nri ya, ndị mmadụ ga-ejupụtakwa nʼebe ahụ. [13] Onye ahụ na-egbuwa ụzọ ga-anọ nʼihu na-edu ha. Ha ga-etipukwa ọnụ ụzọ ama ahụ, ma site na ya gafee. Eze ha ga-agabigakwa nʼihu ha, ONYENWE ANYỊ ga-anọ nʼisi.”

About this translation

Life Bible app icon
Get the Life Bible app Read offline, sync highlights and notes, and study with your library on any device.