[1] Mgbe ahụ, Jona sitere nʼafọ azụ ahụ kpeere ONYENWE ANYỊ Chineke ekpere. [2] Ọ sịrị, “Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo ONYENWE ANYỊ, ọ zakwara m. Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị, ị nụkwara olu akwa m. [3] Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi, nʼetiti oke osimiri. Osimiri dịkwa m gburugburu, ebili mmiri gị na mmali mmiri gị gabigakwara m nʼisi. [4] Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị chụpụ m; ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’ [5] Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m, ogbu mmiri na-erikpu m. Achara mmiri kekụkwara m nʼisi. [6] Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri, ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi. Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ, ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke m. [7] “Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike, e chetara m gị ONYENWE ANYỊ, ma ekpere m bịakwutere gị, nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ. [8] “Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara, na-agbakụta ebere Chineke azụ. [9] Ma ọ bụ olu abụ ekele ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja. Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere. Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke ONYENWE ANYỊ.’ ” [10] Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ.