[1] ONYENWE ANYỊ zara Job sị: [2] “Onye ahụ na-arụso Onye pụrụ ime ihe niile ụka ọ pụrụ ịdọ ya aka na ntị? Ka onye ahụ na-ebo Chineke ebubo zaghachi ya.” [3] Mgbe ahụ, Job zaghachiri ONYENWE ANYỊ sị: [4] “Abụ m onye na-erughị eru. Oleekwanụ ka m ga-esi zaghachi gị? Eji m aka m kpuchie ọnụ m. [5] Ekwuola m mbụ, ma enweghị m ọsịsa ọzọ kwuokwa ugboro abụọ, ma agaghị m ekwukwa ọzọ.” [6] Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị: [7] “Kwadoo onwe gị dịka dimkpa; enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị, achọkwara m ka i nye m ọsịsa. [8] “Ị ga-aga nʼihu ikwujọ ikpe ziri ezi m? Ị ga-aga nʼihu maa m ikpe ka ị si otu a bụrụ onye ikpe gaara? [9] Ogwe aka gị ọ dị ike dịka nke Chineke? Olu gị ọ pụrụ ịda ụda dịka nke ya? [10] Were ebube na ịdị ukwuu chọọ onwe gị mma, yikwasịkwa onwe gị nsọpụrụ na ugwu dịka uwe. [11] Wụsa iwe gị dị ọkụ nʼebe ndị mpako niile nọ, weda ha nʼala, [12] lekwasịkwa ndị mpako niile anya mee ha ihe ihere, ma tiriekwa ndị na-emebi iwu ebe ha guzo. [13] Likọta ha niile nʼotu nʼaja, kpuchie ihu ha niile nʼala ili. [14] Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-ekwenyere gị, na aka nri nwere ike ịzọpụta gị. [15] “Lee enyi mmiri anya, bụ nke m kere dịka m si kee gị, ma ihe ọ na-eri bụ ahịhịa dịka ehi. [16] Lee ike dị nʼukwu ya, leekwa ike dị nʼime afọ ya. [17] Ọdụdụ ya ka ọ na-efegharị dịka osisi sida; akwara dị ya nʼahụ ka e jikọtara nke ọma. [18] Ọkpụkpụ ya niile dịka ogidi bronz nwere ụmị, ọkpụkpụ ụkwụ na aka ya dịka okporo igwe. [19] Ya onwe ya bụ otu nʼime ọrụ aka mbụ nke Chineke, ma naanị onye kere ya nwere ike iji mma agha bịa ya nso. [20] Ugwu na-enye ya ihe ọ na-eri. Nʼebe ahụ kwa ka ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ na-anọ egwuri egwu. [21] Ọ na-edina nʼokpuru ahịhịa na-eto nʼakụkụ mmiri, zookwa onwe ya nʼetiti ahịhịa riidi nʼapịtị. [22] Ahịhịa lotus na-eji ndo ya kpuchie ya, osisi pọpla nke dị nʼakụkụ mmiri gbara ya gburugburu. [23] Ọ bụladị mgbe ebili mmiri na-ama, ọ dịghị atụ egwu; ọ na-anọ nwayọọ, nʼagbanyeghị na mmiri Jọdan na-asọpụta na-asọju ya nʼọnụ. [24] Onye pụrụ ijide ya mgbe ọ na-ele anya, maọbụ were ọnya jide ya mapuo ya imi?