Job 22:1-30 BIU
[1] Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị: [2] “Mmadụ ọ pụrụ ịbara Chineke uru? Ọ bụladị onye nwere uche ọ pụrụ ịbara Chineke uru? [3] O nwere ọṅụ ọ ga-enye Onye pụrụ ime ihe niile ma a sị na ị bụ onye ezi omume? Uru gịnị ka ọ ga-enweta ma ọ bụrụ na ụzọ gị niile enweghị ịta ụta? [4] “Chineke ọ na-abara gị mba na-ebo gị ebubo nʼihi na ị na-atụ egwu ya? [5] Ọ bụ na mmebi iwu gị adịghị ukwuu? Mmehie gị o nwere ọgwụgwụ? [6] Ị naara ụmụnne gị ihe ebe nʼefu; ị yipụrụ ndị mmadụ uwe ha gbawa ha ọtọ. [7] I nyeghị ndị ike gwuru mmiri, i nyeghịkwa ndị agụụ na-agụ ihe oriri. [8] Ọ bụ eziokwu na ị bụ nwoke dị ike na onye nwere ala, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ bi nʼala ya, [9] Ị na-agbaba ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, zipụ ha, Ị na-anyaji ogwe aka nke ụmụ na-enweghị nna. [10] Ọ bụ ya mere ọnya jiri gbaa gị gburugburu, bụrụkwa ihe mbibi ji eyi gị egwu. [11] Ọ bụkwa ya mere ọchịchịrị ji gbaa gị gburugburu ka ị ghara ịhụ ụzọ, meekwa ka idee mmiri kpuchie gị. [12] “Ọ bụ na Chineke anọghị nʼebe dị elu nke eluigwe? Lee ka ịdị elu nke kpakpando dị elu si dị. [13] Kama ị na-asị, ‘Gịnị ka Chineke maara? Ọ na-esite nʼoke ọchịchịrị dị otu a ekpe ikpe? [14] Oke ọchịchịrị kpuchiri ya, nke mere na ọ naghị ahụ anyị mgbe ọ na-agagharị nʼebe dị elu nke eluigwe.’ [15] Ị ga-agbaso ụzọ ochie nke ndị na-eme ihe ọjọọ zoro ije na ya? [16] E bupụrụ ha tupu oge ha eruo. Ntọala ndụ ha ka idee mmiri sachapụrụ [17] Ha sịrị Chineke, ‘Hapụ anyị aka! Gịnị ka Onye pụrụ ime ihe niile ga-eme anyị?’ [18] Ma ọ bụ ya ji ihe dị mma dị iche iche mejupụta ụlọ ha, ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu. [19] Ndị ezi omume na-ahụ mbibi ndị dị otu a ma ṅụrịa; ndị aka ha dị ọcha na-akwa ha emo sị: [20] ‘Nʼezie, e bibiela ndị iro anyị, ọkụ erepịala akụnụba ha.’ [21] “Doo onwe gị nʼokpuru Chineke ka gị na ya nọọ nʼudo, nʼụzọ dị otu a, ọganihu ga-abịara gị. [22] Gee ntị, nabata ndụmọdụ si ya nʼọnụ, doo okwu ya niile nʼobi gị. [23] Ọ bụrụ na ịlaghachikwute Onye pụrụ ime ihe niile, ọ ga-eweghachi gị nʼọnọdụ gị; ọ bụrụ na iwezuga ihe mmebi iwu mee ka ọ dị anya site nʼebe ụlọ ikwu gị dị, [24] tọgbọ ọkpụrụkpụ ọlaedo gị nʼaja, tụpụkwa ọlaedo nke Ọfịa gị nʼelu nkume dị nʼime ọdọ mmiri nta. [25] Mgbe ahụ, Onye pụrụ ime ihe niile ga-abụrụ gị ọlaedo, bụkwara gị ọlaọcha kachasị mma. [26] Nʼezie, mgbe ahụ kwa, ihe nke Onye pụrụ ime ihe niile ga-atọ mkpụrụobi gị ụtọ, ị ga-ewelikwa ihu gị nye Chineke. [27] Ị ga-ekpe ekpere, ọ ga-azakwa gị ekpere gị, ị ga-emezukwa nkwa i kwere. [28] Ihe i kpebiri ga-emezukwa, ìhè ga-amụkwasị nʼụzọ gị niile. [29] Mgbe a na-eweda ndị mmadụ ala, ọ bụrụkwa na ị sị, ‘Bulienụ ha elu,’ mgbe ahụ ọ ga-azọpụta ndị e wedara nʼala. [30] Ọ ga-azọpụta ọ bụladị onye ahụ nke aka ya na-adịghị ọcha, bụ onye nke a ga-azọpụta site nʼịdị ọcha nke aka gị.”
