[1] Mmụọ m tiwara etiwa, ụbọchị m niile dị mkpụmkpụ, ili na-echere ịnabata m. [2] Nʼezie ndị na-akwa emo gbara m gburugburu; anya m na-elekwasịkwa mkpasu iwe ha. [3] “Debere m ihe ebe nʼebe gị Chineke nọ. Olee onye ọzọ pụrụ ịnara m nʼakaebe? [4] I mechiela uche ha ka ha ghara inwe nghọta; ya mere, i gaghị ekwe ka ha nwee mmeri. [5] Ọ bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya, anya ụmụ ya ga-ada mba. [6] “Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla, meekwa ka m bụrụ onye ha na-agbụsa asọ mmiri nʼihu. [7] Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ; ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ. [8] Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a; ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume. [9] Ma otu ọbụla ọ dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha, ndị aka ha dị ọcha ga-aga nʼihu nʼịdị ike. [10] “Ma bịanụ, unu niile, bidonụ okwu unu ọzọ! Agaghị m achọta onye maara ihe nʼetiti unu. [11] Ụbọchị m niile agafeela, atụmatụ m abụrụla ihe lara nʼiyi. Ma ọchịchọ nke obi m [12] na-edo abalị nʼọnọdụ ehihie; nʼihu ọchịchịrị ka ìhè dị nso. [13] Ọ bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili, ọ bụrụ na m agbasaa ihe ndina m nʼelu ọchịchịrị, [14] a sikwa na m asị ire ure, ‘Nna m ka ị bụ,’ maọbụ sị ikpuru ‘Nne m’ maọbụ ‘Nwanne m nwanyị,’ [15] ebeekwa ka olileanya m dị? Onye pụrụ ịhụ ma m nwere olileanya? [16] Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ? Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?”