[45] “Nʼokpuru ndo Heshbọn ka ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ndụ guzoro, na-enweghị onye inyeaka. Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn rere na-aga; ire ọkụ dị ukwuu esitela nʼetiti Saịhọn na-apụ, na-erepịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ahụ ji oke ụzụ na-anya isi.