Jeremaya 34:1-22 BIU
[1] Mgbe Nebukadneza eze Babilọn na ndị agha ya niile, na mba niile dị nʼalaeze nke ọ na-achị na-ebuso Jerusalem na obodo niile gbara ya gburugburu agha, okwu ONYENWE ANYỊ ruru Jeremaya ntị sị, [2] “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel kwuru, Jekwuru Zedekaya bụ eze Juda, gwa ya sị, ‘Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, ejikerela m ugbu a inyefe eze Babilọn obodo a nʼaka. Ọ ga-esurekwa ya ọkụ. [3] Ị gaghị agbanarị ya, nʼihi na ọ ga-ejide gị. A ga-arara gị nyefekwa ya nʼaka. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ eze Babilọn. Gị na ya ga-ekwurịtakwa okwu. Ị ga-agakwa Babilọn. [4] “ ‘Ma nụrụkwa nkwa ONYENWE ANYỊ na-ekwe gị, gị Zedekaya eze Juda. Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru banyere gị, Ị gaghị anwụ site na mma agha; [5] ị ga-anwụ nʼudo. Dịka ndị mmadụ si mụnye ọkụ kwaa ozu nna gị ha, bụ ndị buru gị ụzọ chịa ka eze, otu a ka ha ga-esi mụnye ọkụ kwaa gị. Ha ga-eti aka nʼobi kwa akwa sị, “Ewoo, onyenwe anyị!” Ọ bụ mụ onwe m na-ekwe nkwa a, otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.’ ” [6] Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma gara gwa Zedekaya eze Juda ihe ndị a niile na Jerusalem. [7] Nʼoge a, ndị agha eze Babilọn na-ebuso Jerusalem agha. Ha na-ebusokwa obodo ndị ọzọ nke nọgidere na-ebuso ha agha, nke bụ obodo Lakish na Azeka. Obodo ndị a bụ naanị obodo fọdụrụ nʼala Juda nke ndị agha Babilọn na-emeribeghị. [8] Okwu ONYENWE ANYỊ ruru Jeremaya ntị mgbe Zedekaya bụ eze, na ndị Izrel niile gbachara ndụ na Jerusalem ịkpọsara ndị ohu niile nwere onwe ha. [9] Onye ọbụla ga-ahapụ ohu ya bụ onye Hibru ka o nwere onwe ya, ma ohu ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị. A gaghị agụkwa onye Juu ọbụla dịka ohu ọzọ. [10] Ya mere, ndịisi ọchịchị niile, na ndị niile bụ ndị kwekọrịtara gbaa ndụ a, na ha ga-ahapụ ohu ha ndị nwoke na ndị nwanyị ka ha nwere onwe ha. Ha mekwara dịka ha si kwuo. [11] Ma mgbe oge nta gasịrị, ndị a niile gbanwere obi ha. Ha gara jide ohu ndị ahụ ha hapụrụ, mee ka ha ghọọkwa ndị ohu ha ọzọ. [12] Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYỊ ruru Jeremaya ntị sị ya, [13] “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel, kwuru, Mụ na nna nna unu ha gbara ndụ mgbe m si nʼala Ijipt, bụ ala ebe ha bụ ohu kpọpụta ha. Mgbe ahụ agwara m ha sị, [14] ‘Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhapụ onye Hibru ibe unu resiri unu onwe ya dịka ohu, ka o nwerekwa onwe ya. Mgbe onye ahụ jeere unu ozi afọ isii, unu kwesiri ịhapụ ya ka o nwere onwe ya.’ Ma nna nna unu ha egeghị m ntị, ha etinyeghịkwa uche ha nʼiwu m nyere ha. [15] Na nwa oge nta gara aga unu chegharịrị mee ihe ziri ezi nʼanya m. Onye ọbụla nʼime unu kpọsara inwere onwe nye ndị unu. Unu gara nʼihu gbaa ndụ nʼihu m nʼime ụlọnsọ ahụ a kpọkwasịrị aha m. [16] Ma ugbu a, unu echigharịala, merụọ aha m; onye ọbụla nʼime unu akpọghachikwala nye onwe ya ndị ohu ndị ikom na ndị inyom ahụ unu hapụrụ ka ha nwere onwe ha, gaa dịka o si masị mkpụrụobi ha. Unu akwagidekwala ha ka ha bụrụkwa ndị ohu unu ọzọ. [17] “Nʼihi nke a, ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, Unu erubeghị isi nye m, unu ekwusaghị nwere onwe nye ndị unu. Ya mere, ugbu a mụ onwe m na-akpọsa ‘Inwere onwe’ nye unu, ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, ‘inwere onwe’ nke ịda nʼihi mma agha, na ajọ ọrịa na-efe efe, na oke ụnwụ. Aga m emekwa unu ka unu ghọọ ihe ịsọ oyi nye alaeze niile nke ụwa. [18] Ma ndị ikom ahụ niile merụrụ ọgbụgba ndụ m, ndị ahụ na-edebezughị ọgbụgba ndụ ha gbara nʼihu m, ka m ga-eme ka ha dịrị ka nwa ehi ọgbụgba ndụ ahụ ha kpọwara abụọ, nke ha si nʼetiti ọkara abụọ ya gafee, maka imesi ọgbụgba ndụ ha ike. [19] Ndị ndu Juda na Jerusalem na ndị ozi eze na ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a ndị si nʼetiti ọkara nwa ehi ahụ gabiga [20] ka m ga-enyefe nʼaka ndị iro ha ndị na-achọ iwepụ ndụ ha. Ozu ha ga-abụ ihe oriri nye anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa. [21] “Aga m enyefe Zedekaya eze Juda na ndịisi ọchịchị ya nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọ ndụ ha. Aga m enyefe ha nʼaka ndị agha eze Babilọn, ndị siterela nʼibuso unu agha wezuga onwe ha. [22] Aga m enye iwu, ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, mee ka a kpọghachi ha azụ nʼobodo a. Ha ga-ebuso ya agha, merie ya, surekwaa ya ọkụ. Aga m emekwa ka obodo Juda niile tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya.”
