Jeremaya 10:1-25 BIU
[1] Nụrụnụ ihe ONYENWE ANYỊ na-agwa unu, ụmụ Izrel. [2] Nʼihi na otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, “Unu amụtala ụzọ ndị mba ọzọ, unu atụkwala ụjọ ihe ịrịbama niile nke na-apụta ihe na mbara eluigwe, ọ bụ ezie na ndị mba dị iche iche na-atụ ha ụjọ. [3] Nʼihi na omenaala ndị mmadụ ahụ abaghị uru. Ha na-aba nʼọhịa gbute osisi, nke onye ǹka osisi na-eji anyụike pịara ha ihe. [4] Ha na-eji ọlaọcha na ọlaedo chọọ ihe ahụ a pịrị apị mma, jiri mkpirisi igwe na ǹtu kụọ ya ka o sie ike, ka ọ ghara ịda. [5] Arụsị ha yiri osisi eguzobere nʼubi kukumba maka iji chụọ anụ ufe ọsọ, ha adịghị ekwu okwu. A na-ebugharị ha nʼaka nʼihi na ha adịghị eje ije. Unu atụla ha egwu, nʼihi na ha apụghị imerụ unu ahụ, ha enwekwaghị ike imere unu ihe ọma ọbụla.” [6] O nweghị onye dịka gị, ONYENWE ANYỊ. Ị dị ukwuu. Aha gị dị ukwuu, na-arụpụtakwa ihe dị ike. [7] Onye ka ọ bụ nke na-ekwesighị ịtụ gị egwu? Ọ bụ gị bụ eze mba niile. Ọ bụkwa gị ka e kwesiri ịtụ egwu. Nʼetiti ndị niile maara ihe na mba niile, na nʼalaeze niile, ọ dịghị onye dịka gị. [8] Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu. Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe. [9] A na-esite na Tashish bubata ọlaọcha e tipịaziri nke ọma, site na Ụfaz bubata ọlaedo. Ihe ahụ nke ọka osisi pịrị, nke ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo chọrọ mma ka a na-eyikwasị uwe na-acha anụnụ anụnụ, na uwe na-acha odo odo. Ọ bụkwa ndị ǹka dị iche iche na-eme ha niile. [10] Ma naanị ONYENWE ANYỊ bụ Chineke nʼezie. Ọ bụ Chineke dị ndụ, na Eze nke ebighị ebi. Mgbe iwe were ya, ụwa na-ama jijiji. Mba niile apụghịkwa ịnagide iwe ya dị ọkụ. [11] “Ihe ndị a ka unu ga-agwa ha, ‘Chi ndị ahụ niile a na-esiteghị nʼaka ha mee eluigwe na ụwa niile ga-ala nʼiyi. A ga-ewezuga ha site nʼụwa na nʼokpuru eluigwe niile.’ ” [12] Ma Chineke sitere nʼike ya mee ụwa. Ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya, ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile. [13] Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa. Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie. Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo, na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya niile na-ewepụta ifufe. [14] Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ. Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ. Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ; ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha. [15] Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo, mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi. [16] Ma Onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a, nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile, tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya. ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya. [17] Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a, nʼihi na lee, ndị iro gbara unu gburugburu. [18] Nʼihi na ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, “Nʼoge a, aga m amafu ndị niile bi nʼala a. M ga-eme ka oke mkpagbu bịakwasị ha, meekwa ka ndị iro ha jide ha.” [19] Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ. Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ. Ma ana m akasị onwe m obi na-asị, “Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.” [20] Ebibiela ụlọ ikwu m, e tibisiala ụdọ ya niile. Ụmụ m ndị ikom esitela nʼebe m nọ pụọ, ha anọkwaghị ya. Ọ dịkwaghị onye fọdụrụ nke ga-enyere m aka isetipụ ụlọ ikwu m, maọbụ onye ga-edoziri m ebe m ga-anọ zuo ike. [21] Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche. Ha adịghị ajụta ase site nʼaka ONYENWE ANYỊ, ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma, igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala. [22] Gee ntị, nụrụ! Lee ozi na-abịa, oke ụzụ nke ọgbaaghara site nʼala dị nʼugwu, ime ka obodo niile nke Juda tọgbọrọ nʼefu, ghọọkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa. [23] O ONYENWE ANYỊ, amaara m na ụzọ mmadụ adịghị nʼaka ya, na ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-agbaso. [24] Ya mere, ONYENWE ANYỊ, site nʼụzọ nke ikpe ziri ezi dọọ m aka na ntị, ma ọ bụghị site nʼiwe gị, ma ọ bụghị ya, ị ga-eme ka m ghọọ ihe efu. [25] Wụkwasị ọnụma gị nʼelu mba niile dị iche iche bụ ndị na-amaghị gị, wụkwasịkwa ya ndị ahụ niile na-adịghị akpọku aha gị. Nʼihi na ha eripịala Jekọb, ha eripịala ya kpamkpam, bibiekwa ebe obibi ya.
