Jenesis 47:1-31 BIU

[1] Josef gara gwa Fero sị, “Nna m na ụmụnne m ejirila igwe ewu na atụrụ ha, igwe ehi ha na ihe niile ha nwere site nʼala Kenan bịa nʼebe a. Ha nọ nʼala Goshen.” [2] Mgbe ọ gara ịgwa Fero okwu, o duuru mmadụ ise nʼetiti ụmụnne ya ndị ikom gosi ha Fero. [3] Fero jụrụ ụmụnne ya ajụjụ sị ha, “Gịnị bụ ọrụ aka unu?” Ha zara sị ya, “Ndị ohu gị bụ ndị ọzụzụ atụrụ dịka nna nna anyị ha.” [4] Ha kwukwara sị, “Anyị bịara ịnọ dịka ọbịa nʼala a nʼihi na ụnwụ a siri oke ike nʼala Kenan. O nweghị nri igwe ewu na atụrụ anyị nwere iri nʼala ahụ. Ya mere, anyị na-arịọ ka i nye ndị ohu gị ike ka ha biri nʼala Goshen.” [5] Fero gwara Josef sị, “Nna gị na ụmụnne gị abịakwutela gị. Ha biri nʼala Goshen. [6] Ala Ijipt dịkwa gị nʼihu. Họrọ ebe ọbụla masịrị gị nke dịkwa ezi mma nye nna gị na ụmụnne gị ka ha biri. Ka ha biri na Goshen. Ọ bụrụkwa na ị maara ndị ikom nʼetiti ha ndị nwere ike, mee ha ndị na-elekọta igwe anụ ụlọ m.” [7] Josef kpọtara nna ya Jekọb, mee ka o guzo nʼihu Fero. Jekọb nọ nʼebe ahụ gọzie Fero. [8] Fero jụrụ Jekọb sị, “Ị gbaala afọ ole ugbu a?” [9] Jekọb zara Fero sị ya: “Ebiela m dịka onye ọbịa narị afọ na iri afọ atọ. Ọnụọgụgụ afọ ndị a ehighị nne, ma ha jupụtara nʼahụhụ na nsogbu. Ma a nọrubeghị m ọnụọgụgụ afọ nna m ha gbara mgbe ha biri nʼụwa dịka ọbịa.” [10] Jekọb gọziri Fero, site nʼihu ya pụọ. [11] Ya mere, Josef mere ka nna ya na ụmụnne ya biri nʼala Ijipt. O nyere ha ala kachasị mma nʼala ahụ na mpaghara Ramesis, dịka Fero nyere nʼiwu. [12] Josef nyere nna ya na ụmụnne ya na ezinaụlọ nna ya nri dịka ọnụọgụgụ nke ụmụ ha si dị. [13] Ma nri adịghị nʼala ahụ niile nʼihi na ụnwụ ahụ dị nnọọ njọ. Ihe siri ike nʼala Ijipt ma nʼala Kenan nʼihi ụnwụ a. [14] Josef chịkọtara ego niile dị nʼala Ijipt, na nʼala Kenan, nke ndị mmadụ ji kwụọ ụgwọ nri ha zụrụ webata ha nʼụlọeze Fero. [15] Mgbe ego niile dị ndị mmadụ nʼaka gwụchara nʼala Ijipt ma nʼala Kenan, ndị Ijipt niile bịakwutere Josef sị ya, “Nye anyị nri, gịnị mere anyị ga-eji nwụọ nʼihu gị? Ego anyị agwụla.” [16] Mgbe ahụ Josef zara sị ha: “Jirinụ anụ ụlọ unu kwụọ ụgwọ nri m ga-enye unu, ebe ọ bụ na ego unu agwụla.” [17] Ya mere, ha kpụtaara Josef anụ ụlọ ha. Josef nyere ha nri nʼọnọdụ ịnyịnya ha, na atụrụ ha, na ewu ha, na ehi, na ịnyịnya ibu ha. O were nri zụọ ha nʼafọ ahụ nʼọnọdụ anụ ụlọ ha niile. [18] Mgbe afọ ahụ gafesịrị, ha bịakwutekwara ya nʼafọ nke ọzọ sị ya, “Anyị agaghị ezoro onyenwe anyị na ego anyị agwụla, na igwe anụ ụlọ anyị bụkwa nke gị. O nweghị ihe ọzọ fọdụrụ anyị karịa ahụ anyị na ala anyị. [19] Gịnị mere anyị ga-eji nọọ nʼagụụ nʼihu gị? Zụrụ anyị na ala anyị nʼọnọdụ ụgwọ anyị ga-akwụ maka nri ị ga-enye anyị. Ka anyị na ala anyị bụrụ ndị ohu Fero. Nye anyị mkpụrụ ubi ka anyị dịrị ndụ ghara ịnwụ, ka ala a ghara ịbụ ihe tọgbọrọ nʼefu.” [20] Ya mere, Josef zụtaara Fero ala Ijipt niile. Ndị Ijipt niile nʼotu nʼotu rere ala ha nʼihi oke ụnwụ ahụ dakwasịrị ha. Mgbe ahụ, ala ha niile ghọrọ nke Fero. [21] Ya mere, Josef si otu a mee ka ndị Ijipt niile ghọọ ndị ohu Fero, site nʼotu obodo nʼala ahụ ruo na nke ọzọ ya. [22] Ala nke Josef na-azụtaghị nʼoge a bụ naanị ala ndị nchụaja. Nʼihi na ndị nchụaja si nʼaka Fero na-enweta nri ha site nʼoge ruo nʼoge. Ha nwekwara nri na-ezuru ha site na oke ahụ Fero na-enye ha. Ya mere ha ereghị ala ha. [23] Mgbe ahụ, Josef gwara ndị mmadụ ahụ niile okwu sị, “Lee, azụọla unu taa, zụkwaa a ala unu nye Fero. [24] Nʼoge owuwe ihe ubi, otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ihe unu nwetara nʼubi unu bụ nke Fero. Deberenụ onwe unu ụzọ anọ fọdụrụ ka ọ bụrụ ihe unu ga-akụ nʼubi na ihe unu ga-eri na ihe ndị ezinaụlọ unu, na nke ụmụntakịrị unu ga-eri.” [25] Ha zara sị ya, “Ị zọpụtala ndụ anyị. Ka anyị hụta amara nʼihu nna anyị ukwu. Anyị ga-abụ ndị ohu Fero.” [26] Josef mere ka nke a bụrụ iwu nʼala Ijipt niile ruo taa, na Fero ga-ewe otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ihe ọbụla si nʼala. Naanị ihe si nʼala ndị nchụaja bụ nke na-esoghị nʼiwu a. [27] Izrel biri na Goshen nke dị nʼala Ijipt. Ha kpatara akụ hie nne, mụbaa nʼọmụmụ, ma nʼọnụọgụgụ. [28] Jekọb biri nʼala Ijipt afọ iri na asaa. Ya mere, afọ niile Jekọb gbara bụ narị afọ na iri afọ anọ na asaa. [29] Mgbe ụbọchị ọnwụ Izrel na-abịaru nso, ọ kpọrọ Josef nwa ya sị ya, “Ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu gị, tinye aka gị nʼokpuru apata m, kwee m nkwa na ị ga-egosi m obi ebere na ezi ntụkwasị obi. Elila m nʼala nʼIjipt. [30] Kama, mgbe m nwụrụ, site nʼala Ijipt bupụ m. Buru ozu m gaa lie ya ebe e liri nna m ha.” Ọ zara, “Aga m eme dịka i kwuru.” [31] Ọ sịrị ya, “Ṅụọrọ m iyi na ị ga-eme ya.” Josef ṅụọrọ ya iyi. Izrel nʼonwe ya, kpọrọ isiala dịka ọ dabere nʼelu mkpanaka ya.

About this translation

Life Bible app icon
Get the Life Bible app Read offline, sync highlights and notes, and study with your library on any device.