Jenesis 25:1-34 BIU
[1] Ebraham lụrụ nwunye ọzọ, onye aha ya bụ Ketura. [2] Ọ mụụrụ ya Zimran, Jokshan, Medan, Midian, Ishbak na Shua. [3] Jokshan bụ nna Sheba na Dedan. Ụmụ ndị ikom Dedan bụ Ashurim, Letushim, na Leumim. [4] Ụmụ ndị ikom Midian bụ Efaa, Efe, Hanok, Abida, na Eldaa. Ndị a niile bụ ụmụ Ketura. [5] Ebraham nyere Aịzik ihe niile o nwere. [6] Ebraham nyere ụmụ ndị ikom ndị iko ya nwanyị mụtara onyinye dị iche iche, zipụ ha nʼala dị nʼebe ọwụwa anyanwụ, mgbe ọ ka nọ ndụ, ka ha ghara ịnọ nwa ya nwoke Aịzik nso. [7] Ebraham dị ndụ ruo narị afọ na iri afọ asaa na ise. [8] Ebraham kubiri ume ndụ nwụọ mgbe o mere nnọọ ezigbo agadi, agadi nwoke nke ndụ juru afọ, e mere ka ọ lakwuru ndị ya. [9] Ụmụ ya, Aịzik na Ishmel, liri ya nʼọgba Makipela nʼakụkụ Mamre, nʼala ubi Efrọn nwa Zoha onye Het, [10] ala ahụ Ebraham zụrụ site nʼaka ndị Het. Ebe ahụ ka e liri Ebraham ya na Sera nwunye ya. [11] Mgbe Ebraham nwụrụ, Chineke gọziri nwa ya nwoke Aịzik onye bi nʼoge ahụ na nso nso Bịa-Lahai-Rọị. [12] Nke a bụ akụkọ banyere usoro ezinaụlọ Ishmel nwa Ebraham onye Hega, nwanyị Ijipt ahụ na-ejere Sera ozi mụụrụ ya. [13] Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Ishmel nʼusoro ọmụmụ ha. Nebaiot bụ nwa mbụ ya. Ndị ọzọ bụ Keda, Adbel, Mibsam, [14] Mishma, Duma, Masa, [15] Hadad, Tema, Jetua, Nafish na Kedema. [16] Ndị a bụ ụmụ Ishmel, ndị a bụkwa aha ndịisi ikwu iri na abụọ ha, dịka ebe obibi ha si dị, na dịka ọmụma ụlọ ikwu ha si dị. [17] Ishmel biri ndụ ruo narị afọ na iri afọ na asaa. Ọ nwụrụ, e mere ka ọ lakwuru ndị ya. [18] Ụmụ ụmụ ya bi nʼala dị site na Havila ruo Shua nso nso oke ala ndị Ijipt, nʼụzọ e si aga Ashọ. Ha na ụmụnna ha ndị ọzọ ebighị nʼudo. [19] Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Aịzik nwa Ebraham. Ebraham bụ nna Aịzik. [20] Aịzik gbara iri afọ anọ mgbe ọ lụrụ Ribeka, nwa Betuel, onye Aram si nʼobodo Padan Aram, nwanne Leban, onye Aram. [21] Aịzik kpere ekpere rịọọ ONYENWE ANYỊ ka o nye nwunye ya nwa nʼihi na ọ bụ nwanyị aga. ONYENWE ANYỊ zara ekpere ya. Nwunye ya, Ribeka dịịrị ime. [22] Ụmụ o bu nʼafọ bidoro na-alụ ọgụ nʼime afọ ya. Nʼihi nke a, o kwuru sị, “Gịnị mere ihe dị otu a ji eme m?” Ya mere, ọ gara jụta ase nʼaka ONYENWE ANYỊ. [23] ONYENWE ANYỊ gwara ya sị, “Mba abụọ dị gị nʼafọ, ụzọ mba abụọ dị nʼime gị ka a ga-ekewa. Otu ụzọ ga-adị ike karịa nke ọzọ, nke okenye ga-ejere nke nta ozi.” [24] Mgbe oge ime ya zuru, ụmụ abụọ dị nʼakpanwa ya. [25] Ahụ nwa nke mbụ buru ụzọ pụta na-acha uhie uhie, ahụ ya niile dịka uwe ajị. Nʼihi ya, ha kpọrọ aha ya Ịsọ. [26] Emesịa, nwanne ya pụtara, ma aka ya jidere ikiri ụkwụ Ịsọ. Nʼihi ya, a kpọrọ aha ya Jekọb. Aịzik gbara iri afọ isii mgbe Ribeka mụrụ ha. [27] Ha abụọ toro, Ịsọ ghọrọ onye ọka nʼịchụ nta, onye na-epiogharị nʼọhịa, ebe Jekọb bụ nwoke dị nwayọọ, onye na-anọ nʼetiti ụlọ ikwu. [28] Aịzik hụrụ Ịsọ nʼanya nʼihi na ụtọ anụ Ịsọ na-egbute nʼọhịa na-adị ya mma, ma Ribeka hụrụ Jekọb nʼanya. [29] Otu ụbọchị, Jekọb nọ na-esi ofe mgbe Ịsọ si nʼọhịa bata. Agụụ na-agụkwa ya nke ukwuu. [30] Ịsọ rịọrọ Jekọb sị, “Nyetụ m ụfọdụ nʼime nri a na-acha uhie uhie ị na-esi ka m rie, nʼihi na agụụ na-agụ m hie nne.” (Ọ bụ ihe a mere e ji na-akpọ ya Edọm.) [31] Ma Jekọb zara ya, “Buru ụzọ resi m ọnọdụ ịbụ ọkpara gị.” [32] Ịsọ sịrị, “Gịnị bụ uru ọnọdụ ịbụ ọkpara bara mgbe m na-anwụ nʼagụụ?” [33] Jekọb sịrị ya, “Buru ụzọ ṅụọrọ m iyi.” Ya mere, ọ ṅụụrụ ya iyi, sị otu a resi Jekọb ọnọdụ ọkpara ya. [34] Mgbe ahụ, Jekọb nyere Ịsọ achịcha na ofe lentil o siri. O riri, ṅụọkwa, bilie ọtọ pụọ. Ya mere Ịsọ ledara ọnọdụ ịbụ ọkpara nna ya anya.
