Jenesis 15:1-21 BIU
[1] Mgbe nke a gasịrị, okwu ONYENWE ANYỊ ruru Ebram site nʼọhụ, sị ya, “Atụla egwu, Ebram Abụ m ọta gị, ụgwọ ọrụ dị ukwu nke i nwere.” [2] Ma Ebram zara sị ya, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ, gịnị bụ ihe ị ga-enye m ebe ọ bụ na m amụtaghị nwa? Lee, ọ bụ Elieza, onye Damaskọs, ga-eketa akụ m niile.” [3] Ebram gara nʼihu kwuo sị, “Ebe ọ bụ na m amụtaghị ụmụ, ọ bụ ohu nọ nʼụlọ m ga-eketa akụ m.” [4] Ma okwu ONYENWE ANYỊ rutere ya, “Nwoke a agaghị eketa ihe i nwere, kama nwa nwoke nke ga-esi nʼahụ gị pụta ga-eketa ihe i nwere.” [5] Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ kpọpụtara Ebram nʼezi sị ya, “Lelie anya gị elu na mbara eluigwe, gụọ kpakpando niile ị hụrụ ọnụ, ma ị ga-enwe ike ịgụta ha.” Ọ gwara ya sị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị. A gaghị agụta ha ọnụ.” [6] Ebram kweere nʼihe ONYENWE ANYỊ kwuru. Nʼihi nke a, a gụnyere ya okwukwe a dịka ezi omume. [7] ONYENWE ANYỊ gwakwara ya sị, “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, onye si nʼala Ụọ nke ndị Kaldịa kpọpụta gị, inye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nweta gị.” [8] Ma Ebram zara sị, “Biko, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ olee otu m ga-esi mara na m ga-enweta ya?” [9] ONYENWE ANYỊ zara sị ya, “Wetara m nwa nne ehi gbara afọ atọ, na nne ewu gbara afọ atọ, na ebule gbara afọ atọ, na nduru, na nwa kpalakwukwu.” [10] Ebram wetaara ya ihe ndị a niile bọwaa ha ụzọ abụọ, doo ha nʼusoro ka otu akụkụ chee akụkụ nke ọzọ ihu. Ma ọ bọwaghị ụmụ nnụnụ ndị ahụ. [11] Mgbe anụ ufe fekwasịrị ozu anụ ndị ahụ, Ebram chụpụrụ ha. [12] Mgbe anwụ bidoro ịda, Ebram dara nʼoke ụra, oke ụjọ na oke ọchịchịrị dakwasịrị ya. [13] Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara ya sị, “Mata nke ọma na ụmụ ụmụ gị ga-anọ dịka ndị ọbịa nʼala na-abụghị nke ha. A ga-edo ha ọnọdụ dịka ndị ohu, mejọọ ha narị afọ anọ. [14] Ma aga m ata mba ahụ ha na-efe dịka ohu ahụhụ. Nʼikpeazụ, ha ga-eji ọtụtụ akụ si nʼebe ahụ pụta. [15] Ma ị ga-anwụ nʼudo. A ga-eli gị mgbe ị kara ezi nka. [16] Mgbe ọgbọ anọ gasịrị, ụmụ ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala a. Nʼihi na mmehie ndị Amọrait erubeghị nʼuju ya.” [17] Mgbe anwụ dara, mgbe ọchịchịrị gbachiri ebe niile, ite ọkụ na-akwụ anwụrụ ọkụ nke nwere ọwa na-enwu ọkụ si nʼetiti ibe anụ ndị ahụ gafee. [18] Nʼụbọchị ahụ ka ONYENWE ANYỊ na Ebram gbara ndụ. Ọ sị, “Ndị agbụrụ gị ka m ga-enye ala ndị a, malite nʼiyi ndị Ijipt ruo nʼiyi ukwu Yufretis. [19] Ala ndị Ken, na nke ndị Keniz, na nke ndị Kadmọn, [20] na ala ndị Het, na nke ndị Periz na nke ndị Refaim, [21] na ala ndị Amọrait na nke ndị Kenan na nke ndị Gigash na nke ndị Jebus.”
