Jenesis 10:1-32 BIU
[1] Ndị a bụ akụkọ banyere Shem, Ham na Jafet, ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ha onwe ha mụtara ụmụ nke aka ha, mgbe uju mmiri gafesịrị. [2] Ụmụ ndị ikom Jafet bụ: Goma, Magog, Madai, Javan, Tubal, Meshek na Tiras. [3] Ụmụ ndị ikom Goma bụ: Ashkenaz, Rifat na Togama. [4] Ụmụ ndị ikom Javan bụ: Elisha, Tashish, Kitim na Rodanim. [5] (Site nʼagbụrụ ndị a bi nʼakụkụ mmiri ka e nwetara mba dị iche iche, nʼagbụrụ ha nʼime obodo ha dị iche iche, ndị ọbụla nʼime ha nwekwara asụsụ nke ha.) [6] Ụmụ ndị ikom Ham bụ: Kush, Ijipt, Put na Kenan. [7] Ụmụ ndị ikom Kush bụ: Seba, Havila, Sabta, Raama na Sabteka. Ụmụ ndị ikom Raama bụ: Sheba na Dedan. [8] Kush bụ nna Nimrọd, onye mesịrị bụrụ dike nʼagha nʼụwa. [9] Ọ bụ dike nʼịchụ nta, nʼihu ONYENWE ANYỊ. Ọ bụ nke a mere e ji na-ekwu okwu na-asị, “Ị dị ka Nimrọd, dike nʼịchụ nta, nʼihu ONYENWE ANYỊ.” [10] Obodo ndị bụ mmalite alaeze ya bụ, Babel, Erek, Akad na Kalne, ndị dị nʼala Shaịna. [11] Site nʼala ahụ ọ gara Asịrịa, ebe o wuru obodo Ninive na Rehobọt Ia, na Kala, [12] na Resin, nke dị nʼetiti Ninive na Kala, ya bụ obodo ukwu ahụ. [13] Ijipt bụ nna ndị Lud, ndị Anam, ndị Lehab, ndị Naftuh, [14] ndị Patrus, ndị Kasluh (onye ndị Filistia sitere na ya) na ndị Kafto. [15] Kenan bụ nna Saịdọn, ọkpara ya, na ndị Het, [16] ndị Jebus, ndị Amọrait, ndị Gigash, [17] ndị Hiv, ndị Aka, ndị Sini, [18] ndị Avad, ndị Zema na ndị Hamat. Emesịa, ndị ikwu Kenan gbasara, [19] oke ala ndị Kenan sitere na Saịdọn ruo Gera, gbatịa ruo Gaza, ruokwa Sọdọm, Gọmọra, Adma na Zeboiim, nke dị nso Lasha. [20] Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ham, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha bi, na obodo ha dị iche iche. [21] A mụụrụ Shem ụmụ ndị ikom, onye nwanne nwoke nke tọrọ ya bụ Jafet. Ọ bụkwa nna nna ochie ụmụ ndị ikom niile Eba mụtara. [22] Ụmụ ndị ikom Shem bụ Elam, Ashua, Apakshad, Lud na Aram. [23] Ụmụ ndị ikom Aram bụ, Uz, Hul, Geta na Meshek. [24] Apakshad bụ nna Shela, Shela bụrụ nna Eba. [25] Eba mụtara ụmụ ndị ikom abụọ: Aha otu nʼime ha bụ Peleg, nʼihi na ọ bụ nʼoge ndụ ya ka e kewara ụwa. Aha nwanne ya nwoke bụ Joktan. [26] Joktan bụ nna Almodad, Shelef, Hazamavet, Jera, [27] Hadoram, Ụzal, Dikla, [28] Obal, Abimael, Sheba, [29] Ọfịa, Havila na Jobab. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Joktan. [30] Akụkụ ala ha bi gbasapụrụ site na Mesha ruo Sefa nʼala ugwu ugwu nke ọwụwa anyanwụ. [31] Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Shem, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha dị, na obodo ha dị iche iche. [32] Ndị a bụ ndị ikwu ụmụ Noa ndị ikom dịka usoro ọmụmụ ha si dị, dịka ha si biri na mba dị iche iche. Ọ bụ site na ndị a ka mba niile si gbasasịa ruo akụkụ niile nke ụwa mgbe uju mmiri ahụ gafechara.
