Izikiel 46:2 BIU

[2] Nwa eze ga-esitekwa na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama bata, guzoro nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ndị nchụaja ga-edozikwa aja nsure ọkụ ya, na aja udo ya. Ọ ga-anọkwa nʼụlọ mbata kpọọ isiala nke ofufe ya, sitekwa nʼebe ahụ pụọ. Ma a gaghị emechi ọnụ ụzọ ahụ tutu ruo anyasị.

About this translation

Life Bible app icon
Get the Life Bible app Read offline, sync highlights and notes, and study with your library on any device.