Izikiel 35:1-15 BIU

[1] Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, [2] “Nwa nke mmadụ, chee ihu imegide nʼugwu Sia, buo amụma megide ya, [3] sị ya, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị: Mụ onwe m na-emegide gị, gị ugwu Sia. Aga m esetikwa aka m imegide gị, mee gị ka ị ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. [4] Obodo gị niile ka m ga-eme ka ha ghọọ mkpọmkpọ ebe, gị onwe gị ga-abụkwa ebe tọgbọrọ nʼefu. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. [5] “ ‘Nʼihi na i sitere nʼiro ahụ dị gị nʼobi siterịị na mgbe ochie rara ụmụ Izrel nye nʼaka mma agha, nʼoge ha nọ na-ahụju anya, nʼoge ahụ ịta ahụhụ nke ajọ omume ruru nʼogo dị ukwuu. [6] Nʼihi nke a, ebe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri, aga m enyefe gị nʼaka ndị na-awụsi ọbara. Ọbara ga-achụkwa gị ọsọ. Ebe ọ bụ na ị kpọghị iwusi ọbara asị, ọbara a ga-awụsị nʼime gị ga-achụ gị ọsọ. [7] Aga m eme ka ugwu Sia ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Aga m esitekwa nʼime ya bipụ ndị na-abata abata, na ndị na-apụ apụ. [8] Ugwu ukwu gị niile ga-ejupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ, ugwu nta niile, na ndagwurugwu niile na mgbawara niile dị nʼala ga-ejupụta nʼozu ndị e ji mma agha gbuo. [9] Ị gaghị ebulitekwa isi gị ọzọ. Ebe tọgbọrọ nʼefu ka ị ga-abụ ruo ebighị ebi. A gaghị ewuzikwa obodo gị ọzọ. Ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. [10] “ ‘Nʼihi na ị sịrị, “Mba abụọ ndị a, na ala abụọ ndị a ga-abụ nke anyị, anyị ga-enweta ha,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ nọ nʼebe ahụ. [11] Nʼihi ya, ebe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri, aga m emeso gị mmeso dịka ịba ụba nke iwe gị na ekworo gị si dị, bụ nke i gosiri mgbe ị kpọrọ ha asị. Aga m emekwa ka ha mata onye m bụ, mgbe m kpesịrị gị ikpe. [12] Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ nụrụ okwu ọjọọ ndị ahụ niile i kwuru megide ugwu Izrel niile, na-asị, “E meela ha ebe tọgbọrọ nʼefu, ewerela ha nyefee anyị nʼaka ka anyị dọgbuo ha.” [13] Unu nyakwara isi megide m, kwuo okwu kwugide m dịka o si dị unu mma. Anụkwara m ihe niile unu kwuru. [14] Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị, Mgbe ụwa niile na-aṅụrị ọṅụ ka m ga-eme ka ị ghọọ mkpọmkpọ ebe. [15] Dịka ị ṅụrịrị ọṅụ mgbe ihe nketa Izrel ghọrọ mkpọmkpọ ebe, otu a ka m ga-esi mesoo gị mmeso. Ị ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ nʼefu, gị ugwu Sia, gị na ndị Edọm niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.’ ”

About this translation

Life Bible app icon
Get the Life Bible app Read offline, sync highlights and notes, and study with your library on any device.