Ilu 28:1-28 BIU
[1] Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha, ma ndị ezi omume na-enwe ntụkwasị obi dịka ọdụm. [2] Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi, ma onyeisi nwere ezi nghọta na ihe ọmụma ga-eme ka udo na-adịgide ogologo oge. [3] Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye, bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị. [4] Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume, ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha. [5] Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara, ma ndị na-eso ONYENWE ANYỊ na-aghọta ihe bụ uru ya. [6] Ọ kaara gị mma ịbụ nwa ogbenye na onye eziokwu karịa na ị bụ ọgaranya na eze aghụghọ. [7] Ụmụ okorobịa nwere nghọta na-eme ihe iwu kwuru, ma nwa nke ya na ndị oke oriri bụ enyi na-emenye nna ya ihere. [8] Onye na-eme ka akụ ya baa ụba site na ịnara ụma maọbụ ọmụrụnwa nʼaka onye ogbenye, na-ekpokọta ya nye onye ọzọ, onye na-emere ndị ogbenye ebere. [9] Onye na-ewezuga ntị ya site nʼebe iwu m dị, ọ bụladị ekpere ha bụ ihe arụ. [10] Onye ọbụla na-eduhie ndị ziri ezi nʼụzọ ihe ọjọọ, ga-adaba nʼọnya ahụ ha onwe ha gbara, ma ndị na-enweghị ịta ụta ga-anata ezi ihe nketa. [11] Nʼanya nke onwe ya, onye ọgaranya na-agụ onwe ya dịka onye maara ihe, ma nʼezie, onye ogbenye nwere nghọta na-enyochapụta amaghị ihe nke onye ọgaranya. [12] Mgbe ihe na-agara ndị ezi omume nke ọma, onye ọbụla na-aṅụrị ọṅụ, ma onye ọbụla na-ezo onwe ya mgbe onye na-emebi iwu na-aga nʼihu. [13] Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya. Ma onye na-ekwupụta mmehie ya hapụkwa ha, ka a ga-emere ebere. [14] Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ na-atụ egwu Chineke, ma onye na-enupu isi na-etinye onwe ya na nsogbu. [15] Dịka ọdụm na-agbọ ụja maọbụ nne bịa na-achụ mmadụ otu a ka onye ọchịchị ọjọọ nke na-achị ndị na-enweghị ike dị. [16] Ọ bụ naanị eze na-amaghị ihe ga-akpagbu ndị ya; ma eze ga-achị ogologo oge bụ eze kpọrọ iri ngarị asị. [17] Obi ogbu mmadụ ga na-ama ya ikpe ruo ala mmụọ. Ka onye ọbụla ghara inyere ya aka. [18] Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe, ma onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ ga-adaba nʼolulu. [19] Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ. [20] Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị, ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ. [21] Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya. Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri. [22] Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya amaghị na ụkpa nọ na-eche ya. [23] Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ. [24] Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa, “Olee ihe ọjọọ dị na ya?” Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi. [25] Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu, ma ndị na-atụkwasị ONYENWE ANYỊ obi na-enwe ọganihu. [26] Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu! Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha. [27] Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị. Ma ọbụbụ ọnụ dịrị ndị ahụ na-ekpuchi anya ha nʼebe ndị ogbenye nọ. [28] Mgbe ndị ajọ omume na-aga nʼihu, ndị ezi omume na-ezo onwe ha, ma mgbe ha nʼala nʼiyi, ndị ezi omume nʼaba ụba.
