Ilu 16:1-33 BIU

[1] Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime, ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ ONYENWE ANYỊ. [2] Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya, ma ONYENWE ANYỊ na-atule ebumnobi niile nke mmadụ. [3] Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka ONYENWE ANYỊ, ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu. [4] ONYENWE ANYỊ na-eme ka ihe niile rụpụta ebumnuche ya, o bụladị ndị mmebi iwu ka e debere maka ụbọchị mbibi. [5] ONYENWE ANYỊ kpọrọ ndị nwere obi dị mpako asị. Mara nke a nke ọma: Ha aghaghị ịta ahụhụ. [6] Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie; ọ bụkwa site nʼegwu ONYENWE ANYỊ ka mmadụ ji agbanarị mmehie. [7] Mgbe ụzọ mmadụ na-agbaso na-atọ ONYENWE ANYỊ ụtọ, ọ na-eme ka mmadụ ahụ na ndị iro ya dị nʼudo. [8] Ọ dị mma inwe ihe nta nʼezi omume karịa inwe ọtụtụ uru nʼụzọ ikpe na-ezighị ezi. [9] Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị, maọbụ ONYENWE ANYỊ na-edu ije anyị. [10] Egbugbere ọnụ eze na-ekwu okwu sitere na-ezi nghọta, ọnụ ya adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi. [11] Ihe ọtụtụ ziri ezi na ihe niile ha nʼotu dịrị ONYENWE ANYỊ, ihe niile e ji atụ ihe dị nʼime akpa bụ ya mere ha. [12] Ndị eze kpọrọ ime ihe na-adịghị mma asị, nʼihi na site nʼezi omume ka ocheeze ji eguzosi ike. [13] Ndị eze na-enwe mmasị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu eziokwu, ha na-agụ onye na-ekwu eziokwu dị ka ezi mmadụ. [14] Iwe eze bụ onyeozi nke ọnwụ. Onye maara ihe ga-eme ka ọ dajụọ. [15] Mgbe ọchị dị nʼihu eze ọ na-ewetara onye hụrụ ya ndụ, ihuọma ya dị ka igwe ojii na-eweta mmiri ozuzo. [16] Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo. [17] Ụzọ dị larịị nke onye ziri ezi bụ iwezuga onwe ya pụọ nʼihe ọjọọ, ndị na-echebe ụzọ ha niile na-echebekwa ndụ ha. [18] Nganga na-eweta ịla nʼiyi, mpako na-ewetakwa ọdịda. [19] Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga, na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha. [20] Onye ọbụla na-aṅa ntị na ndụmọdụ ka ihe na-agara nke ọma, onye a gọziri agọzi bụ onye ahụ nke na-atụkwasị ONYENWE ANYỊ obi. [21] A na-amata onye nwere uche site nʼụdị nghọta o nwere. Okwu dị ụtọ na-eme ka mmadụ mụta ihe nke ọma. [22] Inwe uche bụ isi iyi ndụ nye ndị niile nwere ya, ma enweghị uche na-ewetara ndị nzuzu ntaramahụhụ. [23] Obi onye maara ihe na-eme ka e tinye uche nʼokwu ọnụ ya, egbugbere ọnụ ha na-emekwa ka mmụta gaa nʼihu. [24] Okwu dị nro na-atọ ụtọ ka mmanụ aṅụ, ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, na-enyekwa ọkpụkpụ ahụ ike. [25] Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ. [26] Agụụ ihe oriri nke onye ọrụ na-arụpụtara ya ọrụ; agụụ na-akpali mmụọ ya ịga nʼihu. [27] Ndị ọjọọ na-atụpụta echiche ọjọọ, egbugbere ọnụ ha dị ka ọkụ nke na-ekpochapụ ahụ. [28] Onye na-emebi iwu na-agbasa ise okwu; ha na-akpali nsogbu, na-ekewa enyi na enyi. [29] Ndị ọjọọ na-arafu ndị agbataobi ha, na-edubakwa ha nʼụzọ ga-ewetara ha mbibi. [30] Onye ji ikuanya ya ekwu okwu na-atụ atụmatụ ọjọọ, onye na-atabi egbugbere ọnụ ya abụọ ekpebiela ime mmehie. [31] Isi awọ bụ okpueze nke mara mma, a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume. [32] Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya. Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha. [33] A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche ONYENWE ANYỊ, maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ.

About this translation

Life Bible app icon
Get the Life Bible app Read offline, sync highlights and notes, and study with your library on any device.