Ilu 14:1-35 BIU

[1] Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya, ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya. [2] Ime ihe ziri ezi bụ ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ; ma ndị na-ejehie nʼụzọ ha na-akpọ ya asị. [3] Ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu mpako, ma egbugbere ọnụ onye maara ihe na-echebe ha. [4] Mgbe ehi na-adịghị, ụlọ ebe a na-azụ anụ na-adị ọcha, ma site nʼike ehi ihe omume nke ubi na-ejupụta nʼụlọ. [5] Onye akaebe eziokwu adịghị aghọgbu mmadụ, ma onye akaebe ụgha na-agha ụgha mgbe ọbụla. [6] Onye na-akwa emo na-achọ amamihe ma ọ dịghị achọta ya; ma ihe ọmụma na-abịara onye nwere nghọta ọsịịsọ. [7] Si nʼebe onye nzuzu wezuga onwe gị, nʼihi na ị gaghị achọta ihe ọmụma nʼọnụ ya. [8] Amamihe nke onye nwere uche bụ ihe na-eme ka ọ mata ebe ọ na-aga, ma enweghị uche nke ndị nzuzu bụ aghụghọ. [9] Ndị nzuzu na-eji okwu idozi ihe mmehie mebiri akwa emo; ma obi ebere ka a na-achọta nʼetiti ndị omume ha ziri ezi. [10] Ọ bụ naanị onye ihe na-eme maara ụfụ ya, ọ dịghị onye ọzọ ga-eso keta ọṅụ ya. [11] A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi, ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu. [12] Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ. [13] Ọ bụladị nʼime ọchị obi mgbu na-adị, ma ọṅụ nwere ike kwụsị nʼiru ụjụ. [14] Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi aghaghị inweta ụgwọ ọrụ ha, ma ezi mmadụ ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ ya. [15] Onye na-enweghị uche na-ekwenye ihe niile a gwara ya; ma onye nwere uche na-atule mara ebe ọ na-eje. [16] Onye mara ihe na-atụ egwu ONYENWE ANYỊ na-ewezugakwa onwe ya nʼihe ọjọọ, ma onye nzuzu na-ewebiga iwe oke ma na-eche na ọ ka bụ onye kwesiri ntụkwasị obi. [17] Onye iwe ọkụ na-eme ihe nzuzu, ma onye na-echepụta nzube ọjọọ ka a na-akpọ asị. [18] Ndị na-enweghị uche na-enweta ụgwọ ọrụ nke uche gbagọrọ agbagọ, ma onye nwere uche na-enweta ihe ọmụma. [19] Ndị ọjọọ ga-akpọ isiala nʼihu ndị ezi mmadụ, ndị ajọ omume ga-ada nʼọnụ ụzọ ama ndị ezi omume. [20] Ọ bụladị ndị agbataobi onye ogbenye na-akpọ ya asị, ma ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi. [21] Onye na-eleda onye agbataobi ya anya na-emehie, ma onye na-emere ndị ogbenye ebere ka ihe ga-agara nke ọma. [22] Ndị na-ezube ihe ọjọọ, ha ọ naghị akpafu? Ma ndị na-ezube ihe ọma na-achọta ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. [23] Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru; ma oke okwu na-eweta ụkpa. [24] Okpueze nke ndị maara ihe bụ akụnụba ha, ma enweghị uche nke ndị nzuzu na-emepụta naanị ihe na-abaghị uru. [25] Onye na-agba akaebe eziokwu na-anapụta ndụ mmadụ, ma onye akaebe ụgha bụ onye aghụghọ. [26] Onye ọbụla na-atụ egwu ONYENWE ANYỊ nwere ebe mgbaba; nye ụmụ ya ọ ga-abụkwa ebe ize ndụ. [27] Ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ bụ isi iyi nke ndụ; nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ. [28] Otuto onye eze na-enwe dabeere nʼọnụọgụgụ ndị ọ na-achị, e wezuga ndị ọ na-achị, eze enweghị ugwu ọbụla. [29] Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta, ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya. [30] Ndụ dị jụụ na-eme ka ụbọchị mmadụ dị ogologo; ekworo na-eme ka o ree ure. [31] Onye ọbụla na-emegbu onye ogbenye na-elelị Chineke kere ha anya, ma onye na-emere onye ogbenye ebere na-asọpụrụ Chineke. [32] Ọ bụladị nʼọnwụ onye ezi omume nwere ebe mgbaba nʼime Chineke, ma ndị ajọ omume na-ala nʼiyi, mgbe mbibi bịara. [33] Nʼobi onye nwere nghọta ka amamihe na-anọgide, ma ọ bụladị nʼetiti ndị nzuzu ọ na-eme ka amara ya. [34] Ezi omume na-ewuli mba elu, ma mmehie bụ ihe ihere nye ndị ọbụla. [35] Eze na-aṅụrị ọṅụ nʼihi odibo maara ihe; ma odibo na-eweta ihere na-akpali oke iwe ya.

About this translation

Life Bible app icon
Get the Life Bible app Read offline, sync highlights and notes, and study with your library on any device.