Diuteronomi 15:1-23 BIU
[1] Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, ị ga-akagbu ụgwọ niile mmadụ ji gị. [2] Otu a ka a ga-esi mee ya: Onye ọbụla e ji ụgwọ ga-akagbu ụgwọ niile onye Izrel ibe ya ji ya. Ọ gaghị elekwa anya na onye agbataobi ya maọbụ nwanna ya ga-akwụ ya ụgwọ ahụ, nʼihi na oge a na-ekwusa mgbaghara ụgwọ ONYENWE ANYỊ eruola. [3] Mgbaghara a erughị nʼebe ndị ọbịa nọ, ma ị ghaghị ịkagbu ụgwọ ọbụla nwanna gị ji gị. [4] Otu ọ dị, o kwesighị ka ndị ogbenye dịrị nʼetiti gị, nʼihi nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị ka inweta dịka ihe nketa gị, ọ ga-agọzi gị nke ukwuu, [5] ma ọ bụrụ na i rube isi nye ONYENWE ANYỊ Chineke gị, ma lezie anya debe iwu ndị a niile m na-enye gị taa. [6] ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-agọzi gị dịka o kwere na nkwa. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ego, ị gaghị anọ nʼụkọ! Ị ga-achị ọtụtụ mba, ma ha agaghị achị gị. [7] Ma mgbe ị banyere nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu na-enye gị, a sị na e nwee onye ogbenye nʼetiti gị, nke bụ onye Izrel ibe gị, ị gaghị emechi obi gị maọbụ kechie aka gị megide ya, [8] ị ghaghị ịgbazinye ya ihe dị ka o si chọọ. [9] Lezie anya ka ị ghara inwe ụdị echiche ọjọọ a nʼobi gị sị, “Afọ mgbaghara ụgwọ na-abịa nso,” nʼihi ya, i kechie obi gị jụ ibinye nwanna gị nọ na mkpa ihe ọ chọrọ. Ọ bụrụ na onye ahụ nọ na mkpa akwaa akwa kpọkuo ONYENWE ANYỊ, a ga-agụ gị dịka onye ikpe mmehie mara. [10] Ị ghaghị inye ha site nʼafọ ofufu, meekwa nke a na-enweghị obi ilu, mgbe ahụ, nʼihi nke a, ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị ga-agọzi gị nʼọrụ gị niile nakwa ihe niile nke ị tinyere aka na ya. [11] A ghaghị inwe ndị ogbenye nʼetiti unu, ọ bụ ya mere iwu a jiri dị mkpa. Gbasapụ aka nʼebe nwanna gị na nʼebe ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa nọ. [12] Ọ bụrụ na onye Hibru ibe gị, ndị nwoke maọbụ ndị nwanyị, eresi gị onwe ha, gbakwaara gị odibo afọ isii, nʼafọ nke asaa, ị ghaghị ịhapụ ha ka ha nwere onwe ha. [13] Mgbe ọ hapụrụ ụlọ gị, ezipụkwala ya nʼaka efu! [14] Ị ga-esite nʼigwe anụ ụlọ gị, na nʼebe ịzọcha ọka gị, na nʼebe ịzọcha vaịnị gị, nye ya onyinye pụrụ iche iji sị ya laa nʼudo. Nye ya onyinye a dịka ONYENWE ANYỊ Chineke gị si gọzie gị. [15] Cheta na ị bụrị ohu nʼala Ijipt ma ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị gbapụtara gị. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji na-enye gị iwu a taa. [16] Ma ọ bụrụ na ohu gị asị gị, “Achọghị m ịhapụ gị,” nʼihi na ọ hụrụ gị na ndị ụlọ gị nʼanya, hụkwa na ihe na-agara gị na ya nke ọma, mgbe gị na ya nọ. [17] Were agịga kpọpuo ntị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ gị. Ọ ga-abụkwara gị ohu ogologo ndụ ya niile. Otu aka ahụ kwa ka ị ga-eme ohu gị nwanyị. [18] Enwela obi mwute mgbe ọbụla ị na-ahapụ ohu gị ka o nwere onwe ya, nʼihi na ị ga-echeta na ọ rụụrụ gị ọrụ afọ isii, ihe i mefukwara erughị ọkara ihe ị gaara eji goo ndị ọrụ. ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-agọzikwa gị nʼihe niile ị na-eme. [19] Nwa oke ehi ọbụla maọbụ nwa atụrụ ọbụla maọbụ nwa ewu ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼime igwe anụ ụlọ gị ka ị ga-edo nsọ nye ONYENWE ANYỊ Chineke gị, ejila nwa mbụ nke ehi gị e buru ụzọ mụọ arụ ọrụ ubi, akpachakwala ajị nwa ewu maọbụ nwa atụrụ ọbụla e buru ụzọ mụọ dị nʼime igwe ewu na atụrụ gị. [20] Gị na ezinaụlọ gị ga-eri anụ ndị a nʼihu ONYENWE ANYỊ Chineke gị afọ ọbụla nʼebe ọ họpụtara. [21] Ma ọ bụrụ na nwa anụ ọbụla e buru ụzọ mụọ nwere nkwarụ, dịka ngwụrọ maọbụ ìsì maọbụ nkwarụ ọbụla nke jọrọ njọ, ị gaghị eji ya achụ aja nye ONYENWE ANYỊ Chineke gị. [22] Kama, ka ọ bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ gị nʼime ụlọ gị. Onye ọbụla, ma ndị dị ọcha ma onye rụrụ arụ nʼoge ahụ ga-eri ya, dịka onye ọbụla pụrụ iri anụ ele maọbụ anụ mgbada. [23] Ma erila ọbara ya. Wụsa ya nʼala dịka mmiri.
