2 Samuel 22:1-51 BIU
[1] Devid buuru ONYENWE ANYỊ okwu niile nke abụ a mgbe ONYENWE ANYỊ napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. [2] Ọ sịrị: “ONYENWE ANYỊ bụ oke nkume m. Ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. [3] Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m. Ya bụ oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya, ebe mgbaba m, na onye nzọpụta m, site nʼaka ndị na-eme ihe ike. [4] “Akpọkuru m ONYENWE ANYỊ; onye e kwesiri inye otuto. Azọpụtara m site nʼaka ndị iro m. [5] Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu; Ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m. [6] Ụdọ niile nke ili kere m agbụ, Ọnya nke ọnwụ guzogidere m. [7] “Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m ONYENWE ANYỊ, akpọkuru m Chineke m. Akwa m ruru ya ntị. O sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m. [8] Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji, ntọala eluigwe makwara jijiji, ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya. [9] Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta; Ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta. Icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta. [10] O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya. [11] Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu, O feliri elu nʼelu nku nke ifufe. [12] O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu, bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe. [13] Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, amụma egbe eluigwe nwupụtara ire ọkụ. [14] ONYENWE ANYỊ sitere nʼeluigwe bigbọọ. Olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda. [15] Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa. O jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha. [16] E kpughere ala ala nke oke osimiri. Gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ, site nʼịba mba nke ONYENWE ANYỊ, na nkuume si nʼimi ya pụta. [17] “O sitere nʼelu setịpụ aka ya, jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile. [18] Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike, bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m. [19] Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m. Ma ONYENWE ANYỊ bụrụ m ihe ndabere. [20] Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara, Ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ. [21] “ONYENWE ANYỊ mesoro m dịka ezi omume m si dị, Ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị. [22] Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke ONYENWE ANYỊ; ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ. [23] Iwu ya niile dị nʼihu m, esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m. [24] Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya, edebekwara m onwe m pụọ na mmehie. [25] ONYENWE ANYỊ kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị, dịka ịdị ọcha m si dị nʼanya ya. [26] “Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke. [27] Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha, ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, Ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ. [28] Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma anya gị dị nʼahụ ndị mpako, I mee ka ha dị ala. [29] Ọ bụ gị, ONYENWE ANYỊ, bụ oriọna m, ONYENWE ANYỊ na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè. [30] Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ; sitekwa na Chineke m apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla. [31] “Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke; okwu ọnụ ONYENWE ANYỊ bụ ihe a nụchara anụcha. Ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. [32] Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị ONYENWE ANYỊ? Onye bụkwa Oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke? [33] Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke. [34] Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu. [35] Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz. [36] Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m, inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu. [37] Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ. Ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ. [38] “Achụrụ m ndị iro m ọsọ, kpochapụ ha. Alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi. [39] Etidara m ha nʼala kpamkpam. Ha enwekwaghị ike ibilite. Ha dara nʼokpuru ụkwụ m abụọ. [40] Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha. I wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m. [41] I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga. Ebibiekwala m ha niile. [42] Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha. Ha kpọkuru ONYENWE ANYỊ, ma ọ zaghị ha. [43] Egwepịara m ha nke ọma, mee ka ha dịrị ka ntụ nke ala. Asụrụ m ha akwụ, zọtọọ ha dịka apịtị nke okporoụzọ. [44] “Ị napụtala m site nʼaka ndị niile na-alụso m ọgụ. Ị chebere m dịka onyeisi nke ọtụtụ mba. Ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi. [45] Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu, ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m. [46] Obi na-ada ha mba. Ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta. [47] “ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ. Otuto dịrị oke nkume m. Mbuli elu dịrị Chineke m, bụ oke nkume ahụ, Onye nzọpụta m. [48] Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ. Onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m. [49] Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m. I mere ka m dị elu karịa ndị iro m. Napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike. [50] Nʼihi nke a, ONYENWE ANYỊ, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche. Aga m abụku aha gị abụ otuto. [51] “Chineke na-enye eze ya mmeri dị ukwuu. Ọ na-egosikwa onye ya o tere mmanụ obi ebere. Ihe ndị a ka ọ na-emere Devid na ụmụ ụmụ ya, ruo mgbe niile ebighị ebi.”
