1 Ihe e mere 2:1-55 BIU
[1] Izrel mụrụ ụmụ ndị ikom ndị a: Ruben, Simiọn, Livayị, Juda, Isaka, na Zebụlọn, [2] Dan, Josef, Benjamin, Naftalị, Gad na Asha. [3] Juda mụtara ụmụ ndị ikom atọ site na nwunye ya Bat-shua, onye Kenan. Aha ha bụ Ịa, Onan na Shela. Ma Ịa ọkpara Juda bụ nnọọ mmadụ ọjọọ nʼihu ONYENWE ANYỊ, nʼihi ya, ONYENWE ANYỊ gburu ya. [4] Juda mụtakwara ụmụ nwoke abụọ ọzọ, Perez na Zera, site na Tama nwunye nwa ya nwoke. Ụmụ ndị nwoke niile Juda dị ise. [5] Ụmụ ndị ikom Perez bụ, Hezrọn na Hamul. [6] Zera mụrụ: Zimri, na Etan, na Heman, na Kalkol, na Dara. Ha dị ndị ikom ise nʼọnụọgụgụ. [7] Ekan nwa Kami, bụ onye ahụ tinyere ndị Izrel na nsogbu, site nʼihe o mere nke gbasara ihe e doro nsọ. [8] Etan mụrụ Azaraya. [9] Hezrọn mụtara Jerameel, Ram na Kaleb. [10] Ram mụrụ Aminadab, Aminadab amụọ Nashọn onyendu a maara ama na Juda. [11] Nashọn mụrụ Salma, Salma amụọ Boaz. [12] Boaz amụta Obed, Obed amụọ Jesi. [13] Nwa nwoke mbụ Jesi mụrụ bụ Eliab; nke abụọ bụ Abinadab, nke atọ bụ Shimea. [14] Nke anọ bụ Netanel, nke ise bụ Radai, [15] nke isii Ozem, nke asaa Devid. [16] Ọ mụkwara ụmụ nwanyị abụọ site nʼaka nwunye ya, ndị aha ha bụ Zeruaya na Abigel. Zeruaya mụrụ Abishai, na Joab, na Asahel. [17] Abigel, nwunye Jeta onye Ishmel mụrụ Amasa. [18] Kaleb nwa Hezrọn lụrụ ụmụ nwanyị abụọ, Azuba na Jeriọt. Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom ndị a Jesha, Shobab na Adọn. [19] Mgbe Azuba nwụrụ, Kaleb lụrụ nwunye ọzọ. Aha ya bụ Efrat, onye mụtaara ya Hua. [20] Hua mụrụ Uri, Uri mụtara Bezalel. [21] Mgbe Hezrọn gbara iri afọ isii, ọ lụrụ ada Makia onye mụtaara ya Segub. Makia bụ nna Gilead. [22] Segub mụrụ Jaịa, onye chịrị iri obodo abụọ na atọ na Gilead. [23] Ma Geshua na Aram dọtara obodo Jaịa nʼagha, dọtakwa Kenat nʼagha, ya na iri obodo nta isii ndị ọzọ gbara ya gburugburu. Ndị a niile bụ ụmụ Makia nna Gilead. [24] Mgbe Hezrọn nwụrụ nʼobodo Kaleb Efrata, Abija nwunye Hezrọn mụtaara ya Ashua, onye bụ nna Tekoa. [25] Jerameel ọkpara Hezrọn mụtara Ram, onye bụ ọkpara ya, mụọkwa Buna, na Oren, na Ozem, na Ahija. [26] Nwunye Jerameel nke abụọ, aha ya bụ Atara, mụtara Onam. [27] Ram ọkpara Jerameel mụtara ụmụ ndị ikom ndị a: Maaz, na Jamin, na Eka. [28] Ụmụ Onam mụrụ bụ Shamai, na Jada. Shamai mụkwara Nadab, na Abishua. [29] Abishua na nwunye ya Abihail mụrụ Aban, na Molid. [30] Ụmụ Nadab mụrụ bụ Seled, na Apaim. Seled nwụrụ na-amụtaghị nwa ọbụla. [31] Ma Apaim mụtara Ishi. Ishi mụrụ Sheshan, Sheshan amụtakwa Alai. [32] Jada nwanne Shamai mụtara ụmụ ndị ikom abụọ, Jeta na Jonatan. Jeta amụtaghị nwa ọbụla, [33] ma Jonatan mụtara ụmụ ndị ikom abụọ: Pelet na Zaza. Ndị a bụ ụmụ Jerameel. [34] Sheshan mụtara ọtụtụ ụmụ nwanyị, ma o nweghị nwa nwoke. O nwere otu ohu bụ onye Ijipt, aha ya bụ Jaha. [35] O weere ada ya nwanyị nye odibo ya bụ Jaha, ka ọ bụrụ nwunye ya. Ọ mụtara ya otu nwa nwoke aha ya bụ Atai. [36] Atai mụrụ Netan, Netan mụrụ Zabad, [37] Zabad amụọ Eflal. Nwa Eflal bụ Obed, [38] ma Obed mụrụ Jehu. Jehu amụọ Azaraya. [39] Azaraya bụ nna Helez, Helez mụrụ Eleasa. [40] Eleasa mụrụ Sismai, Sismai amụọ Shalum. [41] Shalum bụ nna Jekamaya, ebe Jekamaya mụrụ Elishama. [42] Ụmụ ndị ikom Kaleb nwanne Jerameel bụ Mesha onye bụ ọkpara ya, nna Zif, onye mụrụ Maresha nna Hebrọn. [43] Hebrọn mụrụ ndị a: Kora, Tapụọa, Rekem na Shema. [44] Shema mụrụ Raham, onye bụ nna Jokean. Rekem mụrụ Shamai. [45] Ọkpara Shamai bụ Maon, onye mụrụ Bet Zoa. [46] Efaa, iko nwanyị Kaleb, mụtaara ya Haran, Moza na Gazez. Haran mụtakwara nwa ọ kpọrọ aha ya Gazez. [47] Jadia mụtara ndị ikom ndị a: Regem, Jotam, Gesham, Pelet, Efaa na Shaaf. [48] Maaka, iko nwanyị ọzọ Kaleb nwere mụtaara ya ndị a: Sheba na Tiahana, [49] ọ mụtakwara Shaaf, onye bụ nna Madmanna, Sheva nna Makbena, tinyere Gibea. Aha nwa nwanyị Kaleb mụtara bụ Aksa. [50] Ndị a bụ ụmụ Kaleb. Ụmụ Hua, ọkpara Efrata mụrụ bụ, Shobal, nna Kiriat Jearim, [51] Salma nna Betlehem, na Haref, nna Bet-Gadea. [52] Ụmụ Shobal nna Kiriat Jearim mụrụ bụ Haroe, onye mụrụ ọkara ndị ikwu Menuhot. [53] Ya mụtakwara ndị ikwu Kiriat Jearim, ndị Itra, ndị Put, ndị Shumat na ndị Mishra. Nʼime ndị a ka ndị Zorat na ndị Eshtaol si pụta. [54] Salma mụtara ikwu ndị a: Betlehem, ndị Netofa, ndị Atrot Bet Joab, ụfọdụ ndị Manaha na ndị Zoa. [55] Ụfọdụ ha bụ ikwu ndị ode akwụkwọ, ndị bi nʼobodo Jabez: ndị Tirait, na ndị Shimea, na ndị Suka. Ndị a niile bụ ndị Ken, ndị sitere nʼagbụrụ Hamat, nna ndị ikwu Rekab.
